YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 13

13
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.
1Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēchezọm ebighi-ebi?
Rùe ole mb͕e ka I gēzonarim iru-Gi?
2Rùe ole mb͕e ka m'gēdo ndum-ọdu nile nime nkpuru-obim,
Nēru újú n'obim n'ehihie nile?
Rùe ole mb͕e ka agēbuli onye-irom elu ibu onye-isim?
3Legide anya, zam, Jehova, Chinekem:
Nye anyam abua ìhè, ka m'we ghara iraru ura ọnwu;
4Ka onye-irom we ghara isi, Akariwom ya n'ike;
Ka ndi-nkpab͕um we ghara iteghari egwú ọṅù mb͕e anēwezugam n'ọnọdum.
5Ma ọ bu ebere-Gi ka mu onwem tukwasiworo obi;
Ka obim tegharia egwú ọṅù na nzọputa-Gi:
6Ka m'bùkue Jehova abù,
N'ihi na Ọ mesowom nke-ọma.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 13: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in