YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 122

122
Abú Nrigo; nke Devid.
1Aṅuririm ọṅu mb͕e ha nāsim,
Ka ayi je n'ulo Jehova.
2Ukwu-ayi eguzowo
N'ọnu-uzọ-ama-gi nile, Jerusalem;
3Jerusalem, nke ewuworo
Dika obodo nke ejikọtara n'otù nke-ọma:
4Ebe ebo nile rigoworo, bú ebo nile nke Ja,
Iburu Israel ihe-àmà,
Ikele aha Jehova.
5N'ihi na n'ebe ahu ka edoworo oche-eze nile ikpe ikpe,
Bú oche-eze nile ulo Devid nwere.
6Riọnu aririọ bayere udo Jerusalem:
Ndi nāhu gi n'anya gānọ n'udo.
7Ka udo di n'ékpè-gi nile,
Ka inọ-n'udo di kwa n'ulo-gi nile di elu.
8N'ihi umu-nnem na ndi-eyìm,
Biko, ka m'kwue okwu, si, Ka udo di nime gi.
9N'ihi ulo Jehova, bú Chineke-ayi,
M'gāchọrọ gi ọdi-nma.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 122: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in