YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 121

121
Abú Nrigo.
1M'gēweli anyam abua le ugwu nile:
Òle ebe iye-akam gēsi bia?
2Iye-akam nēsi n'aka Jehova bia,
Onye meworo elu-igwe na uwa.
3Ya ekwela ka ewezuga ukwu-gi n'ọnọdu-ya:
Onye nēdebe gi, Ya atula òrù-ura.
4Le, Ọ dighi-atu òrù-ura, Ọ dighi-araru kwa ura,
Bú Onye nēdebe Israel.
5Jehova bu Onye nēdebe gi:
Jehova bu ǹdò-gi n'aka-nri-gi.
6Anyanwu agaghi-etib͕u gi n'ehihie,
Ọnwa agaghi-etib͕u kwa gi n'abali.
7Jehova gēdebe gi ka ihe ọjọ ọ bula ghara idakwasi gi;
Ọ gēdebe nkpuru-obi-gi.
8Jehova gēdebe ọpupu-gi na nbata-gi,
Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 121: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in