YouVersion Logo
Search Icon

ILU 7

7
1Nwam, debe okwu-ọnum nile,
Zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ.
2Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu,
Debe kwa iwum dika nwa-anya nke anya-gi.
3Ke ha na nkpisi-aka-gi nile;
De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi.
4Si amam-ihe, Nwa-nnem nwanyi ka i bu;
Kpọ kwa nghọta nwanyi i mara nke-ọma:
5Ka ha we debe gi ka i pua n'aka nwanyi nābughi nwunye-gi,
N'aka nwanyi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ.
6N'ihi na na window nke ulom
N'oghere-inara-ifufem ka m'lepuru anya;
7M'we hu n'etiti ndi nēnweghi uche,
M'mata n'etiti umu-ndikom,
Otù nwa-okorọbia nke obi amam-ihe kọrọ,
8Ka ọ nāgabiga n'amá na nso nkuku nwanyi ahu,
Ọ bu kwa n'uzọ ulo-ya ka ọ nāzọ ije;
9Na chi-ojiji, n'anyasi nke ubọchi,
Nime nb͕achi nke abali na ọchichiri.
10Ma, le, otù nwanyi zutere ya
Yiri uwe nke nwanyi nākwa iko, ọ bu kwa onye echeworo obi-ya.
11Onye nēme nkpọtu ka ọ bu, buru kwa onye nēwezuga onwe-ya;
Ọ bughi n'ulo-ya ka ukwu-ya nānọ:
12Ub͕u a n'èzí ka ọ nọ, ub͕u a ọ bu n'amá nile,
Ọ bu kwa na nso nkuku nile ọ bula ka ọ nēche anwu.
13Nwanyi ahu we jide ya aka, sutu kwa ya ọnu,
Were iru ihere nādighi si ya:
14Ihe àjà nile nke àjà-udo di n'akam;
Ta ka m'kwughachiworo ihe nile m'kwere na nkwa.
15N'ihi nka ka m'putara izute gi,
Ichọsi iru-gi ike, m'we chọputa gi.
16Ákwà-nb͕abá mara nma ka m'b͕abáworo n'ihe m'ji edina,
Bú ákwà turu agwa nke ogho Ijipt.
17Ewerewom myrrh na aloes na cinnamon
Fesa ihe-ndinam.
18Bia, ka afọ jubiga ayi ókè n'ikwa-iko rue ututu;
Ka ayi me ka obi tọ ayi utọ n'ihu-n'anya nile.
19N'ihi na dim anọghi n'ulo,
O jewo ije di anya:
20Ọ werewo akpa ego n'aka-ya;
N'ubọchi ọnwa-ndọzu ka ọ gālata.
21O were ọtutu urà-ya wezuga nwa-okorọbia ahu ka ọ ba n'ulo-ya,
O were okwu ire-utọ nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya nufue ya.
22Nwa-okorọbia ahu nējeso ya na mberede,
Dika ehi si abia n'ob͕ub͕u-ya,
Ma-ọbu dika nkpọrọ-ukwu si abia n'idọ-aka-na-nti nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya;
23Rue mb͕e àkú gēji b͕apue imeju-ya;
Dika nnunu si eme ngwa ibà n'ib͕udu,
Ma ọ maghi na imegide ndu-ya ka ọ bu.
24Ma ub͕u a, umum, genum nti,
Tọ-kwa-nu nti n'ala n'okwu nile nke ọnum.
25Ekwela ka obi-gi wezuga onwe-ya ba n'uzọ nile nke nwanyi ahu,
Akpafula n'okporo-uzọ-ya nile.
26N'ihi na ọ di ọtutu ndi emeruru aru ka o meworo ka ha da:
E, ndi nwere ume ka ndi-ya nile eb͕uru eb͕u bu.
27Uzọ nile nke ala-mọ ka ulo-ya bu,
Nāridaru ime-ulo nke ọnwu.

Currently Selected:

ILU 7: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in