YouVersion Logo
Search Icon

ILU 6

6
1Nwam, ọ buru na i nọworo madu-ibe-gi na mbe,
Ọ buru na i narawo onye ala ọzọ n'aka ibu onye-mbe,
2Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi ma gi n'ọnyà,
Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi nwude gi.
3Me nka ub͕u a, nwam, we naputa onwe-gi,
N'ihi na i bàwo n'ọbu-aka nke madu-ibe-gi;
Je, kwe ka azọtọ gi n'ukwu, riọchie madu-ibe-gi nti.
4Enyela anya-gi abua ura,
Enye-kwa-la mbubere-anya-gi irù-ura.
5Naputa onwe-gi dika mb͕ada n'aka onye-ntá,
Na dika nnunu n'aka osi-ọnyà.
6Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu;
Le uzọ-ya nile, we mara ihe:
7Nke nēnweghi onye-isi, ma-ọbu onye nēle anya n'ọlu, ma-ọbu onye nāchi achi,
8Ma ọ nēdozi nri-ya na mb͕e okpom-ọku,
Nēkpokọta kwa ihe-oriri-ya na mb͕e owuwe-ihe-ubi.
9Rùe ole mb͕e ka i ganēdina ala, gi onye-ume-ngwu?
Òle mb͕e ka i gēsi n'ura-gi bilie?
10Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà,
Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala;
11Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe,
Ihe-ukọ-gi kwa dika nwoke ji ọta.
12Madu nke jọb͕uru onwe-ya, onye nēme ajọ ihe;
O ji ọnu nke nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ ejeghari;
13O nēb͕u iku-anya-ya, o ji ukwu-ya abua ekwu okwu,
O ji nkpisi-aka-ya nile nēzí ihe.
14Ib͕akuta Chineke azu di n'obi-ya, ọ nēchèputa ihe ọjọ na mb͕e nile:
Ọ nēzisa ise-okwu.
15N'ihi nka nhuju-anya-ya gābia na mberede;
N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.
16Ihe isi di nke Jehova kpọrọ asì;
E, ihe asa di nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya:
17Anya di elu, na ire okwu-ugha,
Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ;
18Na obi nke nēchèputa èchìchè ajọ ihe,
Na ukwu nēme ngwa ib͕aga n'ihe ọjọ;
19Na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume,
Na onye nēzisa ise-okwu n'etiti umu-nne.
20Nwam, chebe ihe nna-gi nyere n'iwu,
Arapu-kwa-la iwu nne-gi:
21Hie ha n'obi-gi mb͕e nile,
Ke ha n'olu-gi.
22Mb͕e i nējeghari, ọ ganēdu gi;
Mb͕e i nēdina ala, ọ ganēche gi;
Mb͕e i teta-kwa-ra, nke ahu gēso gi kparia uka.
23N'ihi na oriọna ka ihe ahu enyere n'iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè;
Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu:
24Idebe gi ka i pua n'aka nwayi ọjọ,
N'aka ire-utọ nke ire nwayi nābughi nwunye-gi.
25Achọsila ima-nma-ya ike n'obi-gi;
Ekwe-kwa-la ka o were gi na mbubere-anya-ya.
26N'ihi na ọ bu n'ihi nwayi nākwa iko ka eji eme ka nwoke biarue nání otù ob͕e achicha:
Nwunye nwoke ọzọ nāchu kwa ntá ndu di oké ọnu-ahia.
27Madu, ọ̀ gāguru ọku tiye n'uwe obi-ya,
Ma uwe-ya agaghi-ere ọku?
28Ma-ọbu madu, ọ̀ gēje ije n'elu icheku-ọku,
Ma ọku agaghi-aru ya n'ukwu-ya abua?
29Otú a ka onye nābakuru nwunye madu-ibe-ya di;
Agaghi-agu onye ọ bula nke nēmetu nwayi ahu aka n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
30Madu adighi-eleda onye-ori anya, mb͕e o nēzu ori
Imeju nkpuru-obi-ya mb͕e agu nāgu ya:
31Ma asi na achọta ya, ọ gākwughachi okpukpu asa;
Àkù nile nke ulo-ya ka ọ gēnye.
32Onye nākwa nwayi iko, obi amam-ihe kọrọ ya:
Onye nēmebi nkpuru-obi nke aka ya ka onye nēme ya bu.
33Ọnyá-ntiputa na nlelì ka ọ gāhu;
Ita-uta-ya kwa, agaghi-ehichapu ya.
34N'ihi na ekworo bu ọnuma nke nwoke;
Ọ gaghi-enwe ọmiko n'ubọchi ọ́bọ̀.
35Ọ gaghi-ahu ihe-ikpuchi-nmehie ọ bula iru ọma;
Ọ gaghi-ekwe kwa, mb͕e i gēme ka ihe-iri-ngo ba uba.

Currently Selected:

ILU 6: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy