YouVersion Logo
Search Icon

ILU 14

14
1Nwanyi ọ bula nke mara ihe ewuwo ulo-ya:
Ma nwanyi nke b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ji aka-ya abua akwada ya.
2Onye nēje ije n'izi-ezi-ya nātu egwu Jehova:
Ma onye nēsihie n'uzọ-ya nile nēleda Ya anya.
3N'ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ome npako di:
Ma eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe gēdebe ha.
4Mb͕e ehi nādighi, ulo anāzù ehi nādi ọcha:
Ma ihe-omume riri nne nēsite n'ike ehi.
5Onye-àmà nke kwesiri ntukwasi-obi adighi-ekwu okwu-ugha:
Ma onye-àmà okwu-ugha nēkupu okwu-ugha dika ume.
6Onye nākwa emò achọwo amam-ihe, ma ọ hughi ya:
Ma ihe-ọmuma diri onye-nghọta nfe.
7Je na ncherita-iru onye-nzuzu,
I gaghi-amata kwa eb͕ub͕ere-ọnu ihe-ọmuma n'aru ya.
8Amam-ihe onye nwere ezi uche bu ighọta uzọ-ya:
Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu aghughọ.
9Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ikpe-ọmuma nākwa emò ha:
Ma n'etiti ndi ziri ezi ka ihe nātọ Chineke utọ di.
10Obi mara ilu nke aka ya;
Ọ bu kwa n'ọṅù-ya ka onye nke nābughi nke ya nādighi-agwakọta onwe-ya.
11Ulo nke ndi nēmebi iwu, agēme ka ọ tọb͕orọ n'efu:
Ma ulo-ikwū nke ndi ziri ezi gāma akwukwọ dika ihe akuku aku.
12Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu,
Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.
13Ọbuná n'ọchì ka ihe nēb͕u obi nb͕u;
Ọzọ, ikpe-azu ọṅù bu iru-újú.
14Site n'uzọ nile nke aka ya ka afọ gēju onye laghachiworo azu n'obi:
Ma ọ bu site n'onwe-ya ka afọ gēju ezi madu.
15Onye nēnweghi uche nēkwere okwu nile ọ bula:
Ma onye nwere ezi uche nāghọta ije-ukwu-ya.
16Onye mara ihe nātu egwu, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya:
Ma onye-nzuzu nēwebiga iwe ókè, we nātukwasi obi.
17Onye nēwe iwe ọsọsọ gēme ihe nke uche b͕agọrọ ab͕agọ:
Ọzọ, onye ọbula nke nēzu nzube ọjọ di iche iche, anākpọ ya asì.
18Ndi nēnweghi uche eketawo uche b͕agọrọ ab͕agọ:
Ma ndi nwere ezi uche ka anēkpube ihe-ọmuma n'isi.
19Ndi ọjọ erudawo ala n'iru ndi ezi madu;
Ndi nēmebi iwu kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke onye ezi omume.
20Ọbuná onye-ab͕ata-obi nke ob͕eye nākpọ ya asì:
Ma ndi nāhu ọgaranya n'anya di ọtutu.
21Onye nēleda madu-ibe-ya anya nēmehie:
Ma onye nēmere ndi ewedara n'ala amara, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.
22Hà adighi-akpafu, bú ndi nēchèputa ihe ọjọ?
Ma ebere na ezi-okwu gādiri ndi nēchèputa ezi ihe.
23Na ndọb͕u nile nke madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu urù di ya:
Ma okwu eb͕ub͕ere-ọnu nēdubà nání n'ihe-ikọ-ukọ.
24Okpu-eze nke ndi mara ihe bu àkù-ha:
Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu nání uche b͕agọrọ ab͕agọ.
25Onye nānaputa nkpuru-obi di iche iche ka onye-àmà nke nēkwu ezi-okwu bu:
Ma onye nēkupu ọtutu okwu-ugha dika ume nāghọ aghughọ.
26N'egwu Jehova ka ntukwasi-obi siri ike di:
Umu-Ya gēnwe kwa ebe-nb͕abà.
27Egwu Jehova bu isi-iyi nke ndu,
Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi.
28N'uba nke ndi ọ bula ka ima-nma eze di:
Ma n'ukọ mba ọ bula ka nbibi onye-isi di.
29Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nwere ọtutu nghọta:
Ma onye nwere obi ọku nēbuli uche b͕agọrọ ab͕agọ.
30Ndu nke anu-aru ka obi agwọrọ ọria-ya bu:
Ma ire-ure nke ọkpukpu nile ka ekworo bu.
31Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike nāta Onye kèworo ya uta:
Ma onye nāsọpuru Ya ka onye nēme ob͕eye amara bu.
32Anenupu onye nēmebi iwu n'ihe ọjọ ya:
Ma onye nwere ebe-nb͕abà n'ọnwu-ya ka onye ezi omume bu.
33N'obi onye-nghọta ka amam-ihe nānọgide:
Ma n'etiti ndi-nzuzu ka ọ nēme ka amara ya.
34Ezi omume nēbuli mba:
Ma ihe-ihere nke ndi nile di iche iche ka nmehie bu.
35Ihe orù nwere uche nātọ eze utọ:
Ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya gādi n'aru onye nēweta ihere.

Currently Selected:

ILU 14: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in