YouVersion Logo
Search Icon

ILU 13

13
1Nwa nke mara ihe nānu idọ-aka-na-nti nna-ya:
Ma onye nākwa emò anughi ibasi-nba-ike.
2Site na nkpuru nke ọnu-ya ka onye ọ bula gēri ezi ihe:
Ma nkpuru-obi ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēri ime-ihe-ike.
3Onye nēche ọnu-ya nche nēdebe ndu-ya:
Ma onye nāsaghepu eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, nbibi gādiri ya.
4Ọ nāchọsi ike, ma ọ dighi ihe o nwere, bú nkpuru-obi onye-ume-ngwu:
Ma nkpuru-obi nke ndi di nkọ, agēme ya ka ọ ma abuba.
5Okwu-ugha ka onye ezi omume nākpọ asì:
Ma onye nēmebi iwu nēsì ísì, we nwe iru-ihere.
6Ezi omume nēchebe onye zuru okè n'uzọ:
Ma nmebi-iwu nēme ka onye-nmehie kpùe iru.
7O nwere onye nēme onwe-ya ọgaranya, ma ọ dighi ihe ọ bula o nwere:
O nwere onye nēme onwe-ya ob͕eye, ma àkù-ya bara uba.
8Ihe-nb͕aputa nke ndu onye ọ bula bu àkù-ya:
Ma ob͕eye anughi ibasi-nba-ike.
9Ìhè ndi ezi omume nāṅuri ọṅu:
Ma oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.
10Nání na nganga ka ilu-ọ̀gù nāputa:
Ma n'aka ndi aduworo ọdu ka amam-ihe di.
11Àkù nke sitere n'ihe-efu gēbilata:
Ma onye ji aka-ya achikọta ihe gāba uba.
12Nchere anēchere ogologo mb͕e di anya nēme ka obi nāria ọria:
Ma osisi nke nēnye ndu ka ihe anāchọsi ike bu, mb͕e ọ biaruworo.
13Onye nēleda okwu Chineke anya nēmebi onwe-ya:
Ma onye nātu egwu ihe enyere n'iwu, onye ahu ka agākwughachi ugwọ.
14Iwu onye mara ihe bu isi-iyi nke ndu,
Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi.
15Ezi uche nēnye amara:
Ma uzọ ndi-nghọb͕u bu nání nkume.
16Onye ọ bula nke nwere ezi uche ji ihe-ọmuma alu ọlu:
Ma onye-nzuzu nāb͕asa uche b͕agọrọ ab͕agọ.
17Onye-ozi nke nēmebi iwu nādabà n'ihe ọjọ:
Ma ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi bu ihe nāgwọ madu.
18Inọ-n'ob͕eye na nlelì gādiri onye nēzere idọ-aka-na-nti:
Ma onye nāriba iba-nba ama ka agāsọpuru.
19Mb͕e ihe anāchọsi ike mere ọ nātọ nkpuru-obi utọ:
Ma ọ bu ihe-árú n'anya ndi-nzuzu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha.
20Nējeso ndi mara ihe, i gāma kwa ihe:
Ma eyì ndi-nzuzu ka agēmejọ.
21Ndi-nmehie ka ihe ọjọ nāchu:
Ma ndi ezi omume ka agākwughachi ezi ihe.
22Ezi madu nēme ka umu umu-ya keta ihe-ya;
Ma ihe anākpakọbara onye ezi omume ka àkù onye-nmehie bu.
23Ọtutu ihe-oriri di n'ubi ndi-ob͕eye:
Ma o nwere nke anēkpochapu site n'ikpe nābughi ikpe.
24Onye nēb͕ochi nkpa-n'aka-ya nākpọ nwa-ya asì:
Ma onye nāhu ya n'anya nādọsi ya aka na nti ike.
25Onye ezi omume nēri ihe rue mb͕e afọ juru nkpuru-obi-ya:
Ma afọ ndi nēmebi iwu, ihe nākọ ya.

Currently Selected:

ILU 13: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in