YouVersion Logo
Search Icon

JOB 23

23
1Job we za, si,
2Ọbuná ta nnupu-isi ka ntamum bu:
Akam di arọ́ n'ihi ize-umem.
3Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na amaram ebe m'gāchọta Ya!
Ma asi na agamabiaru ọnọdu-Ya guzosiri ike!
4Ka m'do ikpém n'usoro n'iru Ya,
Meju kwa onum n'iru-uka.
5Kam'mara okwu nile Ọ gāzaghachim,
Ka m'ghọta kwa ihe Ọ gāsim.
6Ọ̀ bu n'uba ǹke ike-Ya ka O gēkpesom ikpe?
É-è; kama Ya onwe-ya gēchem iru.
7N'ebe ahu ka onye ziri ezi nēso Ya ru uka;
Ewe me ka m'b͕apu n'aka Onye-ikpem rue mb͕e ebighi-ebi.
8Le, m'ga n'iru, ma Ọ nọghi ya;
M'ga kwa n'azu, ma adighm-ahuta Ya:
9M'ga n'aka-ekpe, mb͕e Ọ nālu ọlu, ma adighm-ahu Ya anya:
Ọ nēkpuchi Onwe-ya n'aka-nri, m'we ghara ihu Ya.
10N'ihi na Ọ mawo uzọ m'nāga;
Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m'gāputa.
11Nzọ-ukwu-Ya ka ukwum nējisi ike iso;
Uzọ-Ya ka m'debeworo, adighm-ewezuga kwa onwem.
12Adighm-apu kwa n'ihe enyere n'iwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-Ya;
Atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm.
13Ma Ya onwe-ya nọ n'otù èchìchè, ònye kwa gechighari Ya?
Nkpuru-obi-Ya achọsiwo kwa ike, O we me ya.
14N'ihi na Ọ nēmezu ihe bu òkèm:
Ma ọtutu ihe dika ihe ndia di n'aka-Ya.
15N'ihi ya ka m'nāma jijiji n'iru Ya;
Anamaghọta, m'nātu kwa oké egwu Ya.
16N'ihi na Chineke emewo ka obim lọ miri,
Onye puru ime ihe nile emewo kwa ka m'ma jijiji:
17N'ihi na ekpochapughm n'iru ọchichiri,
O kpuchighi kwa oké ọchichiri n'irum.

Currently Selected:

JOB 23: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in