YouVersion Logo
Search Icon

JOB 22

22
1Elifaz, bú onye Timan, we za, si,
2Ọ̀ bu Chineke ka madu nābara n'ihe?
É-è, kama onye nwere uche nābara onwe-ya n'ihe.
3Ọ̀ nātọ Onye puru ime ihe nile utọ na i bu onye ezi omume?
Ma-ọbu ọ̀ bu urù n'ebe Ọ nọ na i nēme ka uzọ-gi nile zue okè?
4Ọ̀ bu egwu-gi kpatara O ji bara gi nba,
We so gi ba n'ikpé?
5Ìhe ọjọ gi abaghi uba?
Ọ dighi kwa nsọtu diri ajọ omume-gi.
6N'ihi na i narawo nwa-nne-gi ihe-ibe n'efu,
Uwe nile nke ndi b͕a ọtọ ka i nēyipu kwa.
7I dighi-eme ka onye nāda #mbà ṅua miri,
I nēb͕ochi kwa nri n'ebe onye-agu nọ.
8Ma nwoke nke ogwe-aka-ya di ike, ọ bu ya nwe uwa;
Onye anāhu iru-ọma nēbi kwa nime ya.
9I zipuwo ndinyom di-ha nwuru n'aka efu,
Anānyaji kwa ogwe-aka nke umu-nb͕ei.
10N'ihi ya ib͕udu di gi buruburu,
Oké egwu mberede nāma kwa gi jijiji,
11Ma-ọbu ọchichiri, nke i nādighi-ahu anya,
Na njubiga miri nēkpuchi gi.
12Chìneke anọghi n'ebe di elu nke elu-igwe?
Le kwa idi-elu kpakpando, na ha di elu!
13I we si, Gini ka Chineke mara?
Ò gēsi n'azu oké ochichiri kpe ikpe?
14Igwe-oji b͕ara ọchichiri nāburu Ya ebe-nzuzo, Ọ dighi-ahu kwa uzọ;
Ọ bu kwa buruburu elu-igwe ka Ọ nējeghari.
15Ì gēdebe uzọ ochie,
Nke ndikom nēme ajọ ihe zọkwasiworo ukwu?
16Bú ndi apunara, ma mb͕e-ha akērughi,
Ndi awusiri ntọ-ala-ha dika osimiri:
17Ndi nāsi Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi:
Ọzọ, Gini ka Onye puru ime ihe nile gēmere ha?
18Ma Ya onwe-ya mejuru ulo nile ha n'ezi ihe:
Ma ndum-ọdu ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ.
19Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria;
Onye nēmeghi ihe ọjọ nāchì kwa ha ọchì:
20Si, N'ezie ezopuwo ha n'uwa, bú ndi nēbili imegide ayi,
Ọku eripiawo kwa ihe-ha fọduru.
21Biko, mara Ya nke-ọma, we nọ n'udo:
Nime ihe ndia ka ọdi-nma gābiakute gi.
22Biko, nara iwu n'ọnu-Ya,
Do kwa okwu-Ya nile n'obi-gi.
23Ọ buru na i laghachikute Onye puru ime ihe nile, agēwuli gi elu dika ulo;
I gēme ka ajọ omume di anya n'ebe ulo-ikwū-gi nile di.
24Tọb͕ọ kwa àkù-gi n'elu ájá,
Na ọla-edo Ofia n'etiti nkume miri-iyi;
25Onye puru ime ihe nile gābu kwa àkù-gi,
Ọla-ọcha di oké ọnu-ahia ka Ọ gābu-kwa-ra gi.
26N'ihi na mb͕e ahu ihe nke onye puru ime ihe nile gātọ gi utọ,
I gēwelite-kwa-ra Chineke iru-gi.
27I gāriọ Ya aririọ, Ọ gānu kwa gi;
I gākwughachi kwa nkwa-gi nile.
28I gēkwubì kwa okwu, ewe me ka o guzosiere gi ike;
Ìhè gāmukwasi kwa uzọ-gi nile.
29Mb͕e ha gēme ka i di ala, i gāsi, Nweli-elu di;
Onye anya-ya ruru ala ka Ọ gāzọputa kwa.
30Ọ gēme ka onye nābughi onye nēmeghi ihe ọjọ wepuga onwe-ya:
E, o werewo idi-ọcha nke ọbu-aka-gi abua wepuga onwe-ya.

Currently Selected:

JOB 22: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in