YouVersion Logo
Search Icon

EKLISIASTIS 4

4
1Mu onwem we legharia anya bu nmeb͕u nile anēmeb͕u n'okpuru anyanwu: ma, le, anya-miri nke ndi anēmeb͕u, ma ọ dighi onye-nkasi-obi ha nwere; ma n'akuku ndi nēmeb͕u ha ka ike di, ma ọ dighi onye-nkasi-obi ha nwere. 2Mu onwem we ja ndi nwuru anwu, bú ndi nwuru anwu na mb͕e di anya gara aga, kari ndi di ndu, bú ndi ahu nke nọ na ndu rue ub͕u a; 3e, ọ di nma kari ha abua, bú onye akādighi, nke nāhughi ọlu ọjọ nke aluworo n'okpuru anyanwu.
4Mu onwem we hu ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu, ya na ọlu nile nāgafe agafe, na ọ bu n'ihi nka ka madu gābu onye madu-ibe-ya gēkwoso ekworo. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe. 5Onye-nzuzu nākpakọba aka-ya abua, nēri kwa anu-aru onwe-ya. 6Ọ di nma, bú otù nju-aka n'izu-ike, kari nju-aka abua n'idọb͕u onwe-gi n'ọlu na ichọ ijide ifufe.
7Mu onwem we laghachi, hu ihe-efu n'okpuru anyanwu. 8Ọ di otù onye nke nání ya di, ọ dighi kwa onye abua ọ nwere; ọ dighi kwa nwa ma-ọbu nwa-nne o nwere; ma ọ dighi nsọtu diri ndọb͕u-ya nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, afọ adighi-eju kwa anya-ya n'àkù. Ọ nāsi, Ọ̀ bu kwa n'ihi onye ka mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu, we me ka ezi ihe kọnari nkpuru-obim? Nka bu kwa ihe-efu, e, nweda-n'ala jọrọ njọ ka ọ bu. 9Abua di nma kari otù; n'ihi na ha nwere ezi ugwọ-ọlu nime ndọb͕u ha nādọb͕u onwe-ha n'ọlu. 10N'ihi na ọ buru na ha ada, otù nime ha gēme ka ibe-ya bilie: ma ahuhu gādiri onye ahu nke nání ya di mb͕e ọ nāda, ọ dighi kwa onye abua o nwere ime ka o bilie. 11Ọzọ, ọ buru na madu abua edinakọ, aru gēkpo kwa ha ọku: ma àru otù onye nke nání ya dina gēsi aṅa kpo ọku? 12Ọ buru kwa na madu enwe ike n'aru otù onye nání ya di, ma otú ọ di, madu abua gēguzo imegide ya; ọzọ, udọ̀ atọ nke atukọtara n'otù, adighi-adọbì ya ngwa ngwa.
13Ọ di nma, bú nwata nke bu ob͕eye ma ọ mara ihe, kari eze nke bu okenye ma ọ bu onye-nzuzu, onye nāmaghi inara nmata-ihe ọzọ. 14N'ihi na n'ulo-nkpọrọ ka o siri puta ibu eze; n'ihi na ọbuná n'ala-eze-ya ka amuru ya ob͕eye. 15Ahurum ihe nile di ndu nke nējeghari n'okpuru anyanwu, na ha di n'akuku nwata, bú nke-abua ahu, nke nēguzo n'ọnọdu ya. 16Ọ dighi nguta diri ndi-ya nile, bú ndi nile ọ di n'iru ha: ma ndi gādi n'ọdi-n'iru agaghi-aṅuri nime ya. N'ezie nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.

Currently Selected:

EKLISIASTIS 4: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in