YouVersion Logo
Search Icon

EKLISIASTIS 3

3
1Ihe ọ bula nwere oge, mb͕e di-kwa-ra ihe ọ bula anēme n'okpuru elu-igwe: 2mb͕e imu nwa, na mb͕e inwu anwu; mb͕e iku ihe n'ubi, na mb͕e iropu ihe akuru; 3mb͕e ib͕u eb͕u, na mb͕e igwọ ọria; mb͕e itikpọ etikpọ, na mb͕e iwu ulo; 4mb͕e ikwa ákwá, na mb͕e ichì ọchì; mb͕e iru újú, na mb͕e ite egwú; 5mb͕e itufu nkume, na mb͕e itukọba nkume; mb͕e ib͕aku, na mb͕e inọrọ nb͕aku n'ebe di anya; 6mb͕e ichọ achọ, na mb͕e ime ka ihe la n'iyì; mb͕e idebe edebe, na mb͕e itufu etufu; 7mb͕e idọwa adọwa, na mb͕e idukọta adukọta; mb͕e ib͕a nkiti, na mb͕e ikwu okwu; 8mb͕e ihu n'anya, na mb͕e ikpọ asì; mb͕e agha, na mb͕e udo. 9Òle ihe fọduru onye nālu ọlu n'ihe nke ya onwe-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya? 10Ahuwom nweda-n'ala nke Chineke nyeworo umu madu iweda ha n'ala nime ya. 11Ihe nile ọ bula ka O meworo ka ọ ma nma na mb͕e-ya: ọzọ, mb͕e ebighi-ebi ka O tiyeworo n'obi-ha, ma ka O si tiye ya madu agaghi-achọputa ọlu ahu nke Chineke luworo site na nmalite we rue na nsọtu. 12Amawom na ọ dighi ezi ihe diri ha, ma-ọbughi ka madu ṅuria ọṅu, me kwa ezi ihe n'ogologo ndu-ya. 13Ọzọ kwa, madu ọ bula nke nēri ihe, nke nāṅu kwa ibe-ọṅuṅu, nke nāhu kwa ezi ihe na ndọb͕u nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, onyinye Chineke ka nke ahu bu. 14Amawom na ihe ọ bula Chineke nēme, nke ahu gādiru mb͕e ebighi-ebi: ọ dighi ihe agātukwasi ya, ọ dighi kwa ihe agēbìlata nime ya: Chineke emewo kwa ya, ka madu we tua egwu n'iru Ya. 15Ihe ọ bula nke diworo, na mb͕e di anya gara aga ka ọ di; ọzọ, ihe ọ bula nke gādi adi, na mb͕e di anya gara aga ka ọ diworo: Chineke nāchọ kwa ihe achupuru achupu.
16Ọzọ kwa, m'huru n'okpuru anyanwu ebe ikpé, na ọ bu n'ebe ahu ka nmebi-iwu di; m'hu-kwa-ra ebe ezi omume, na ọ bu n'ebe ahu ka nmebi-iwu di. 17Mu onwem siri n'obim, Onye ezi omume na onye nēmebi iwu ka Chineke gēkpe: n'ihi na mb͕e diri ihe ọ bula anēme na n'ihi ọlu ọ bula n'ebe ahu. 18Mu onwem siri n'obim, Ọ bu n'ihi umu madu, ka Chineke we meme ka ha puta ìhè, ka ha we hu kwa, na ha onwe-ha bu anumanu, ha n'onwe-ha. 19N'ihi na ihe nādabàra umu madu, ihe nādabà-kwa-ra anumanu; ọbuná otù ihe ahu nādabàra ha: dika ọnwu nke anumanu si di, otú a ka ọnwu nke madu di; e, otù mọ ka ha nile nwere; ọ dighi kwa ọkaka madu nwere kari anumanu: n'ihi na ha nile bu ihe-efu. 20Ha nile nāla n'otù ebe; ha nile siri n'ájá puta, ha nile nālaghachi kwa n'ájá. 21Ònye mara mọ nke umu madu, ma nke ahu nārigo arigo, na mọ nke anumanu, ma nke ahu nārida n'okpuru rue ala? 22M'we hu na ọ dighi ihe di ṅma kari ka madu nāṅuri n'ọlu-ya; n'ihi na nke ahu bu òkè-ya: n'ihi na ònye gēme ka ọ biaghachi ilekwasi ihe gādi mb͕e ọ gasiri?

Currently Selected:

EKLISIASTIS 3: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in