YouVersion Logo
Search Icon

Abụ Ọma 82

82
Abụ Ọma 82
Abụ Ọma Asaf.
Chineke onye ikpe kachasị ndị ikpe
1Chineke na-ewere ọnọdụ ịchị isi nʼetiti ọgbakọ dị ukwuu;
ọ na-ekpebi ikpe nʼetiti chi niile.
2Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ekpe ikpe na-ezighị ezi?
Ruo ole mgbe ka unu ga na-egosi ndị ajọ omume ihuọma? Sela
3Kperenụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị nna ikpe ziri ezi;
hụnụ na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu nwetara ihe ruuru ha.
4Gbapụtanụ ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa;
napụta ha site nʼaka ndị ajọ omume.
5Ha#82:5 Maọbụ, chi ndị a amaghị ihe ọbụla, ha aghọtaghị ihe ọbụla.
Ha na-ejegharị nʼọchịchịrị;
ntọala niile nke ụwa na-ama jijiji.
6“Asịrị m, ‘Unu bụ “chi,”
unu niile bụ ụmụ ndị ikom nke Onye kachasị ihe niile elu.’
7Ma unu ga-anwụ ọnwụ dịka mmadụ ndị ọzọ;
unu ga-ada dịka ndị ọchịchị ọzọ.”
8O Chineke, bilie kpee ụwa ikpe,
nʼihi na mba niile bụ ihe nketa gị.

Currently Selected:

Abụ Ọma 82: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in