1
Abụ Ọma 139:14
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma.
Compare
Explore Abụ Ọma 139:14
2
Abụ Ọma 139:23-24
O Chineke, nyochaa m, mara obi m. Nwaa m, matakwa echiche uche m niile. Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m, ma duo m nʼụzọ ebighị ebi.
Explore Abụ Ọma 139:23-24
3
Abụ Ọma 139:13
Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.
Explore Abụ Ọma 139:13
4
Abụ Ọma 139:16
Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị tupu otu nʼime ha adịrị.
Explore Abụ Ọma 139:16
5
Abụ Ọma 139:1
O ONYENWE ANYị, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma
Explore Abụ Ọma 139:1
6
Abụ Ọma 139:7
Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị? Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m?
Explore Abụ Ọma 139:7
7
Abụ Ọma 139:2
Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile.
Explore Abụ Ọma 139:2
8
Abụ Ọma 139:4
O ONYENWE ANYị, ị maara ihe m gaje ikwu tupu m kwuo ya.
Explore Abụ Ọma 139:4
9
Abụ Ọma 139:3
Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile.
Explore Abụ Ọma 139:3
Home
Bible
Plans
Videos