1
1 Ndị Eze 3:9
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ya mere, nye ohu gị uche nghọta nke m ga-eji chịa ndị gị, na ịghọta ihe dị iche nʼetiti ezi ihe na ajọ ihe. Nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?”
Compare
Explore 1 Ndị Eze 3:9
2
1 Ndị Eze 3:12
Aga m eme dịka ihe ị rịọrọ si dị. Aga m enye gị obi maara ihe na uche ịghọta ihe ziri ezi, nke ga-abụ na ọ dịghị onye ọbụla dịka gị, ọ dịghịkwa onye ọbụla ga-adị ka gị.
Explore 1 Ndị Eze 3:12
3
1 Ndị Eze 3:11
Ya mere, Chineke zara sị ya, “Nʼihi na ị rịọrọ amamihe na nghọta ị ga-eji chịa ndị m, ma ị rịọghị m ka m nye gị ndụ ogologo, maọbụ akụnụba, maọbụ ọnwụ nye ndị iro gị.
Explore 1 Ndị Eze 3:11
4
1 Ndị Eze 3:13
Ọzọkwa, aga m enyekwa gị ihe ndị ahụ ị na-arịọghị m, akụnụba, na nsọpụrụ, ka ọ ga-abụ nʼụbọchị niile nke ndụ gị, ị gaghị enwe onye ọbụla ga-adị ka gị nʼetiti ndị eze niile.
Explore 1 Ndị Eze 3:13
5
1 Ndị Eze 3:14
Ọ bụrụkwa na i jee ije nʼụzọ m niile, debe iwu m, meekwa ihe m gwara gị, dịka nna gị Devid mere, aga m enye gị ogologo ndụ.”
Explore 1 Ndị Eze 3:14
6
1 Ndị Eze 3:5
Na Gibiọn, ONYENWE ANYị mere ka Solomọn hụ ya anya na nrọ nke abalị, Chineke sịrị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.”
Explore 1 Ndị Eze 3:5
7
1 Ndị Eze 3:7
“Ugbu a, ONYENWE ANYị bụ Chineke m, i meela ohu gị eze nʼọnọdụ nna m, bụ Devid. Ma abụ m naanị nwantakịrị na-amaghị otu esi apụ ma na-abatakwa.
Explore 1 Ndị Eze 3:7
8
1 Ndị Eze 3:10
Ọ masịrị Onyenwe anyị na Solomọn rịọrọ nke a.
Explore 1 Ndị Eze 3:10
9
1 Ndị Eze 3:6
Solomọn zara sị, “I gosila ohu gị bụ nna m Devid obi ebere dị ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nye gị, onye ezi omume nakwa onye obi ya ziri ezi. Ị nọgidela na-egosi ya obi ebere dị ukwuu, nyekwa ya nwa nwoke ga-anọkwasị nʼocheeze ya nʼụbọchị taa.
Explore 1 Ndị Eze 3:6
10
1 Ndị Eze 3:8
Ohu gị nọ nʼebe a, nʼetiti ndị gị ị họpụtara, ndị bara ụba nke ukwuu, ndị a na-adịghị agụta ọnụ nʼihi nʼọnụọgụgụ ha babigara ụba oke.
Explore 1 Ndị Eze 3:8
Home
Bible
Plans
Videos