“Oge ọnwụ m eruola,” ka ọ sịrị, “Ya mere, dị ike, meekwa dịka nwoke. Debe iwu niile ONYENWE ANYị bụ Chineke gị nyere, bie ndụ nʼụzọ ya niile. Debekwa ụkpụrụ na ihe niile o nyere nʼiwu, na ntụziaka ya niile dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mee nke a ka ihe niile ị ga-eme gaara gị nke ọma, nʼihe niile ị na-eme, nʼebe ọbụla ị na-eche ihu gị. Ka ONYENWE ANYị mezuo nkwa o kwere banyere m, sị ‘Ọ bụrụ na ụmụ gị na ụmụ ụmụ ha elezie anya nʼotu ha si ebi ndụ, ọ bụrụ na ha ejegharịa nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi nʼihu m, jiri obi ha niile na mkpụrụobi ha mee nke a, ị gaghị achọ onye ga-anọkwasị nʼoche eze Izrel achọ.’