Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ZEKARAIA 11:4-17

ZEKARAIA 11:4-17 Bible Nso (IGBOB)

Otú a ka Jehova, bú Chinekem, siri: Nāzù ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u; nke ndi nāzù ha nēb͕u ha, ma ikpe adighi-ama ha; ọzọ, ndi nēre ha nāsi, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, n'ihi na abum ọgaranya: ndi-ọzùzù-ha adighi-enwe ọmiko n'aru ha. N'ihi na M'gaghi-enwe kwa ọmiko ọzọ n'aru ndi bi n'ala nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ma, le, Mu onwem gaje irara madu ndia nye, onye ọ bula n'aka ibe-ya na n'aka eze-ya: ha gētib͕u kwa ala nka, M'gaghi-anaputa kwa ha n'aka-ha. M'we zùa ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, n'ezie ọ bu ndi ewedara n'ala nke ìgwè ewu na aturu ahu. M'we chiri n'onwem nkpa-n'aka abua; otù ka m'kpọrọ Idi-utọ, nke-ọzọ ka m'kpọrọ Ndi-ọ̀tú-udọ̀, m'we zùa ìgwè ewu na aturu. M'we bipu ndi-ọzùzù-aturu atọ ahu n'otù ọnwa; nkpuru-obim enweghi kwa ntachi-obi n'aru ha, ọzọ, nkpuru-obi-ha asọwokwam oyi. M'we si, M'gaghi-azù unu: nke nānwu anwu, ya nwua; nke anēbipu ebipu, ka ebipu ya; ka ndi fọduru rie, aturu ọ bula anu-aru ibe-ya. M'we were nkpa-n'akam, bú Idi-utọ, b͕ujira ya abua, imebi ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi nile di iche iche b͕ara. Ewe nyajie ya n'ubọchi ahu: otú a ndi ewedara n'ala nke ìgwè ewu na aturu ahu, bú ndi nāribam ama, we mara na okwu Jehova ka ọ bu. M'we si ha, Ọ buru na ọ di nma n'anya-unu, nyenum ugwọ-ọlum; ma ọ dighi, gharanu. Ha we tùa ugwọ-ọlum, bú orú ego ọla-ọcha na iri. Jehova we sim, Tufue ya nye ọkpu-ite, bú ọnu-ahia mab͕uru onwe-ya nke ha rùrum. M'we chiri orú ego ọla-ọcha na iri ahu, tufue ha nye ọkpu-ite, n'ulo Jehova. M'we b͕ujira nkpa-n'akam nke-abua, bú Ndi-ọ̀tú-udọ̀, imebi nwa-nne Juda na Israel bu. Jehova we sim, Were kwa n'onwe-gi ọzọ ihe nke onye-ọzùzù-aturu nke b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya. N'ihi na, le, Mu onwem gaje ime ka otù onye-ọzùzù-aturu bilie n'ala nka, ọ gaghi-elekọta ndi ebipuru ebipu, ọ gaghi-achọ nke achusara achusa, ọ gaghi-agwọ nke ab͕ajiri ukwu na aka; ọ gaghi-azù nke nēguzo eguzo, ma anu nke aturu mara abuba ka ọ gēri, ukwu nile ha ka ọ gānyajisi. Ahuhu diri onye-ọzùzù-aturu efu nke nārapu ìgwè ewu na aturu! mma-agha gādakwasi n'ogwe-aka-ya na n'anya-ya nke aka-nri: ogwe-aka-ya gākpọsi nku, anya aka-nri ya gāhu kwa inyoghi-inyoghi nke-uku.

ZEKARAIA 11:4-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị Chineke m kwuru, “Zụọnụ igwe ewu na atụrụ ndị a ga-egbu egbu nri. Ndị na-azụrụ ha na-egbu ha ma ọ dịghị ahụhụ na-abịakwasị ha. Ndị na-erekwa ha na-asị, ‘Toonu ONYENWE ANYị, nʼihi na abụ m ọgaranya.’ Ndị ọzụzụ ha adịghị enwe ọmịiko nʼahụ ha. Nʼihi na mụ onwe m agakwaghị egosi ndị ala a obi ebere.” Otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri. “Aga m ewere onye ọbụla nʼime ha nyefee nʼaka onye agbataobi ya, na nʼaka eze ha. Ha ga-ebibi ala a kpamkpam, ma mụ onwe m agaghị anapụta onye ọbụla site nʼaka ha.” Nʼihi ya, azụrụ m igwe ewu na atụrụ ndị ahụ a ga-egbu egbu, nke ka nke, ndị ahụ a na-emegbu emegbu. Eweere m mkpanaka abụọ, kpọọ otu nʼime ha Amara, kpọọ nke ọzọ Ịdị nʼotu. Azụkwara m igwe atụrụ ndị ahụ. Nʼime otu ọnwa, ewezugara m ndị ọzụzụ atụrụ atọ. Igwe ewu na atụrụ ndị ahụ kpọkwazịrị m asị, enwezighị m ike nweere ha ndidi. Nʼihi ya, ekwuru m si, “Agaghị m abụkwa onye ọzụzụ atụrụ unu ọzọ. Nke ọbụla na-anwụ, ya nwụọ, ọzọ, nke na-ala nʼiyi, ya laa nʼiyi. Ka ndị fọdụrụ rie anụ ahụ ibe ha.” Mgbe ahụ, eweere m mkpanaka m, nke a kpọrọ Amara gbajie ya abụọ, igosi na emebiela m ọgbụgba ndụ nke mụ na ndị mmadụ gbara. Nʼụbọchị ahụ ka e mere ka ọgbụgba ndụ ahụ gharakwa ịdị. Mgbe ahụ, ndị ahụ a na-akpagbu nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ, bụ ndị na-ele m anya matara na ọ bụ okwu ONYENWE ANYị. Mgbe ahụ, agwara m ha, “Ọ bụrụ na ọ masịrị unu, unu kwụọ m ụgwọ ọrụ m, ọ bụrụkwa na ọ masịghị unu, deberenụ onwe unu ego unu.” Nʼihi nke a, ha gụpụtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, jiri ya kwụọ m ụgwọ. ONYENWE ANYị gwara m, “Tụpụrụ ya ọkpụ ite,” bụ ọnụahịa magburu onwe ya bụ nke ha rụrụ nʼisi m. Ya mere, eweere m iri ọlaọcha atọ ahụ tụpụrụ ya ọkpụ ite nʼụlọnsọ ukwu nke ONYENWE ANYị. Mgbe ahụ, agbajiri m mkpanaka m nke abụọ a na-akpọ Ịdị nʼotu, izipụta na njikọta maọbụ ịdị nʼotu dị nʼetiti Juda na Izrel adịghịkwa. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara m, “Chịrịkwa ngwa ọrụ nke onye ọzụzụ atụrụ nzuzu ahụ, nʼihi na ana m aga ịkpọlite otu onye ọzụzụ atụrụ nke na-agaghị elekọta ụmụ atụrụ furu efu, maọbụ chọọ ndị na-etolite, maọbụ gwọọ ndị merụrụ ahụ, maọbụ nye ndị ahụ dị ike nri. Kama ọ ga-eri anụ atụrụ ndị ahụ ahụ ha dị mma, nyakapụkwa ụkwụ ha niile. “Ahụhụ dịrị onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-abaghị uru, nke na-adịghị elezi igwe ewu na atụrụ ya anya. Ka mma agha gbupụ ya otu aka, ghụpụkwa ya anya aka nri ya. Ka ogwe aka ya kpọnwụọkwa kpamkpam. Otu a, anya aka nri ya ga-akpọkwa.”