ABÙ NKE ABÙ 8:6-8
ABÙ NKE ABÙ 8:6-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi, dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ, ekworo ya dịkwa ike dịka ala mmụọ. Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere, dịka ọkụ nke dị ukwu. Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya, osimiri niile enwekwaghị ike iri ya. Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya, a ga-eleda ya anya nke ukwuu. Anyị nwekwara otu nwanne nwanyị nta ma ọ kpụbeghị ara. Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwanyị, nʼụbọchị a ga-abịa ịlụ ya?
ABÙ NKE ABÙ 8:6-8 Bible Nso (IGBOB)
Tukwasim dika nb͕a-aka-akàrà n'obi-gi dika nb͕a-aka-akàrà n'ogwe-aka-gi: N'ihi na ihu-n'anya di ike dika ọnwu; Ekworo siri ike dika ala-mọ: Nnwupu-ya nile bu nnwupu nke ọku, Ire-ọku nke Ja onwe-ya. Ọtutu miri apughi imenyu ihu-n'anya, Osimiri nile agaghi-erikpu kwa ya: Ọ buru na onye ọ bula gēnye àkù nile nke ulo-ya n'ihi ihu-n'anya, Agēleda ya anya nke-uku. Ayi nwere otù nwa-nne nwayi di ntà, Ma ọ dighi ara ọ kpuru: Gini ka ayi gēmere nwa-nne-ayi N'ubọchi mb͕e agēkwu okwu-ya?