ABÙ NKE ABÙ 5:10-16
ABÙ NKE ABÙ 5:10-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye m hụrụ nʼanya chapụrụ achapụ, dị mma ile anya. Ọ pụrụ iche nʼetiti puku ndị nwoke iri. Isi ya dịka ọlaedo a nụchara anụcha, agịrị isi ya na-eruda dịka igu nkwụ, na-ejikwa nji dịka ugolọma. Anya ya abụọ dịka nduru nọ nʼakụkụ mmiri iyi nke e jiri mmiri ara ehi sachaa, dịka nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị. Nti ya abụọ dị ka ihe ndina ụda nke jupụtara na mmanụ isi ụtọ. Egbugbere ọnụ ya dị ka okoko urodi, nke na-agbụsị mmanụ máá. Aka ya abụọ dị ka mkpara ọlaedo a kpụziri akpụzi, nke a hịọnyere nkume oke ọnụahịa beril nʼime ya. Ahụ ya na-akwọ mụrụmụrụ dịka ọdụ nke e ji nkume dị oke ọnụahịa safaia chọọ mma. Ogwe ụkwụ ya abụọ dị ka ogidi e ji nkume mabụl kpụọ, nke e ji ọlaedo a ṅụchara anụcha tọọ ntọala ha. Ụdịdị ya dị ka Lebanọn, dịkwa oke ọnụ dịka osisi sida ya. Ọnụ ya bụ ihe tọkarịsịrị ụtọ nʼonwe ya, ihe niile banyere ya dị mma nʼile anya. Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, onye dị otu a bụ onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa enyi m.
ABÙ NKE ABÙ 5:10-16 Bible Nso (IGBOB)
Onye ihe-ya nātọm utọ di ọcha nācha kwa uhie uhie, Onye emeworo ka ọ di elu dika ọkọlọtọ kari orú nnù na nnù ise. Isi-ya di ka ọla-edo ọma nke anuchara anucha, Agiri-isi-ya nēruda eruda dika igu nkwu, nēji nji dika ugolo-ọma. Anya-ya abua di ka nduru n'akuku miri-iyi; Nāsa onwe-ha nime miri-ara-ehi, nānọdu n'akuku miri-iyi di iche iche juputara na miri. Ǹtì-ya abua di ka nkpuru uda, dika ulo-elu nke nkpa-akwukwọ nēsì ísì utọ: Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua di ka urodi, nābusi myrrh nērù erù. Aka-ya abua di ka nb͕a-aka ọla-edo, nke ahiọgideworo beryl nime ha: Afọ-ya di ka ọdu nwupuru enwupu, nke ejiworo sapphire kpuchie ya. Ogwe-ukwu-ya abua di ka ogidi marble, nke atọworo ntọ-ala-ha n'elu ukwu ọla-edo anuchara anucha: Iru-ya di ka Lebanon, mara nma nke-uku dika cedar. Okpu-ọnu-ya tọkarisiri utọ: e, aru-ya nile bu ihe anāchọsi ike. Nka bu onye ihe-ya nātọm utọ, nka bu kwa eyìm, Unu umu-ndinyom Jerusalem.