ABÙ NKE ABÙ 2:11-13
ABÙ NKE ABÙ 2:11-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Lee, oge oyi agafeela, udu mmiri agabigakwala. Okoko osisi epupụtala nʼala; oge eji agụ egwu eruokwala, a na-anụ abụ nduru nʼala anyị niile. Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ, isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile. Bilie, ma bịa, ọmasịrị m. Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.”
Kesaa
Gụọ ABÙ NKE ABÙ 2ABÙ NKE ABÙ 2:11-13 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na, le, mb͕e oyi agabigawo, Oké miri-ozuzo agawo, ọ lawo; Ahuwo okoko-ọhia anya n'ala; Mb͕e abù ọma nke umu-nnunu eruwo, Anuwo kwa olu nduru n'ala-ayi; Osisi fig achawo nkpuru fig-ya nāchaghi acha, Osisi vine nile nāb͕awa okoko, Ha esìpuwo ísì utọ ha. Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.
Kesaa
Gụọ ABÙ NKE ABÙ 2