RUT 4:14-17
RUT 4:14-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ndị inyom obodo ahụ bịakwutere Naomi sị ya, “Onye a gọziri agọzi ka ONYENWE ANYị bụ, onye na-agbawaghị gị aka onye agbụrụ mgbapụta dị nso. Ka aha ya bụrụ ihe ga-ada ụda nʼala Izrel niile. Ya wetakwara gị ntute na ndụ gị ma bụrụkwa onye ga-azụ gị nʼisi awọ gị. Nʼihi na nwunye nwa gị, onye hụrụ gị nʼanya, onye baara gị uru karịa ndị ikom asaa, amụọrala gị nwa nwoke.” Naomi kuuru nwantakịrị ahụ, jikụọ ya nʼapata ya, lekọtaa ya. Ndị inyom ndị agbataobi ya sịrị, “Ugbu a, nʼikpeazụ, Naomi enwetala nwa nwoke ọzọ!” Ha gụrụ ya Obed. Ọ bụkwa onye ahụ bụ nna Jesi, onye bụ nna Devid.
RUT 4:14-17 Bible Nso (IGBOB)
Ndinyom we si Naomi, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye n=emeghi ka onye-nb͕aputa kwusiri gi ta, ka akpọ kwa aha-ya n>Israel. _O g=abu-kwa-ra gi onye n=enyeghachi ndu, na onye g=az#u gi n>isi-awọ: n>ihi na nwunye nwa-gi, nke huru gi n>anya, nke diri gi nma kari umu-ndikom asa, amuwo ya. Naomi we kuru nwata ahu, tukwasi ya n>obi-ya, ghọrọ ya onye n=az#u nwa. Ndinyom, b/u ndi-ab͕ata-obi-ya, we kpọ ya aha, si, Amuru nwa-nwoke nye Naomi; ha we kpọ aha-ya Obed: onye ahu bu nna Jesi, nna Devid.