RUT 3:7-11
RUT 3:7-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Boaz risiri nri ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, mmụọ ya dịkwa mma, ọ gara ka ọ dinaa ala na nsọtụ ebe atụkọtara akpa ọka. Rut jiri nwayọọ gaa nʼebe ahụ, kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ, dina nʼakụkụ ụkwụ ya. Nʼetiti abalị Boaz kụjara teta na mberede, tụgharịa, ma lee o nwere nwanyị dina nʼala ala ụkwụ ya. Ọ jụrụ ya sị, “Ị bụ onye?” Rut zara ya sị, “Abụ m Rut, ohu gị nwanyị, onyenwe m. Were ọnụ ọnụ akwa gị kpukwasị m, nʼihi na ị bụ onye agbụrụ mgbapụta m dị nso.” Boaz zara sị ya, “ONYENWE ANYị gọzie gị, nwa m nwanyị. Ịhụnanya i gosiri ugbu a akarịala nke i gosiri na mbụ, nʼihi na i gbasoghị ụmụ okorobịa, ma ha bụ ọgaranya maọbụ ogbenye. Ma ugbu a, nwa m nwanyị, atụla ụjọ. Aga m emezuru gị dịka i si rịọọ, nʼihi na mmadụ niile maara na ị bụ onye nwere ezi agwa.
RUT 3:7-11 Bible Nso (IGBOB)
Boaz we rie ihe, @nu kwa ihe-ọ@nu@nu, obi-ya we di nma, o we ba idina ala na nsọtu obo ọka: Rut we ba nwayọ, kpughepu ukwu-ala-ya abua, dina ala. O rue, n>etiti abali, na nwoke ahu mara jijiji, we chigharia: ma, le, ot#u nwayi n=edina n>ukwu-ala-ya. O we si, Onye ka i bu? _O si, Mu onwem bu Rut, or#u-gi nwayi: b͕asa kwa ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi n>aru or#u-gi nwayi; n>ihi na onye-nb͕aputa ka i bu. _O si, Nwayi agọziri agọzi diri Jehova ka i bu, nwam: i mewo ebere nke-ọma n>ikpe-azu kari na mbu, ebe i n=ejesoghi umu-okorọbia, ma ọ bu onye n=enweghi ike ma-ọbu ọgaranya. Ma ub͕u a, nwam, atula egwu; ihe ọ bula nke i n=asi, m>g=emere gi ya: n>ihi na ọnu-uzọ-ama nile nke ndim mara na nwayi n=ejide onwe-ya nke-ọma ka i bu.