RUT 3:1-5
RUT 3:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Naomi, b/u nne di-ya, we si ya, Nwam, #m>gaghi-achọrọ gi izu-ike, ka o we diri gi nma? Ma ub͕u a, Boaz, onye gi na umu-ab͕ọghọ-ya nọri, #ọ bughi onye ayi mara? Le, ya onwe-ya n=afucha ọka barley n>abali a n>ebe-nzọcha-ọka. Sa kwa aru-gi, te manu n>aru gi, b͕okwasi uwe-nb͕okwasi-gi nile n>aru gi, ridarue ebe-nzọcha-ọka: emela ka nwoke ahu mara gi, rue mb͕e o risiri ihe, @nusi kwa ihe-ọ@nu@nu. O g=eru kwa, mb͕e o dinara ala, na i g=amara ebe o n=edina, i g=ab#a kwa, kpughepu ukwu-ala-ya abua, dina ala; ya onwe-ya g=egosi kwa gi ihe i g=eme. O we si ya, Ihe nile i sirim, m>g=eme ya.
RUT 3:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu ụbọchị, Naomi, nne di Rut, gwara ya okwu sị, “Nwa m nwanyị, ọ bụ na o rubeghị mgbe m ga-achọtara gị ụlọ nke aka gị, ebe a ga-anọ lekọtazie gị anya nke ọma? Ọ bụ na Boaz, onye gị na ụmụ agbọghọ ya so rụọ ọrụ ịchịkọta ọka abụghị onye agbụrụ anyị? Lee, nʼabalị taa ka ọ ga-afụcha ọka balị nʼebe ịzọcha ọka. Ugbu a, gaa saa ahụ gị, teekwa mmanụ isi ụtọ, yirikwa uwe mara mma. I mesịa, gaa nʼebe ịzọcha ọka, ma ekwekwala ka ọ hụ gị, tutu ruo mgbe o risiri nri ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ. Leziekwa anya chọpụta ebe ọ ga-edina rahụ ụra. Mgbe ị maara na ọ rahụla ụra nke ọma, gaa kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya, dinaakwa ala nʼebe ahụ. Ọ ga-agwa gị ihe ị ga-eme.” Rut zara sị, “Aga m eme ihe ọbụla ị sị m mee.”