RUT 1:14-18
RUT 1:14-18 Bible Nso (IGBOB)
Ha we welie olu-ha, kwa /akw/a ọzọ: _Opa we sutu nne di-ya ọnu; ma Rut rapara n>aru ya. O we si, Le, nwunye nwa-nne di-gi alaghachikuruwo ndi-ya, laghachikuru chi-ya: gi soro nwunye nwa-nne di-gi laghachi. Rut we si, ariọlam irapu gi, isi n>iso gi laghachi: n>ihi na ebe i n=eje ka m>g=eje; ọ bu kwa ebe i n=anọ ọnọdu-abali ka m>g=anọ ọnọdu-abali: ndi-gi g=abu ndim, Chineke-gi g=abu kwa Chinekem: ebe i nwuru ka m>g=anwu, ọ bu kwa n>ebe ahu ka ag=el#im: Jehova mem ot/u a, mekwam ihe ọzọ ot/u a, mb͕e ihe n=abughi ọnwu onwe-ya g=ekewa mu na gi. _O we hu na nwayi ahu n=ab͕a obi-ya ume iso ya je, o we ghara igwa ya okwu ọzọ.
RUT 1:14-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ha welitere olu ha kwaa akwa ọzọ. Mgbe ahụ Ọpa suturu nne di ya ọnụ ma Rut kwusịrị ike nʼebe ọ nọ. Ma Naomi gwara ya sị, “Lee, nwunye nwanne di gị alaghachikwurula ndị nwe ya na chi ya niile, soro ya laa.” Ma Rut zara, “Akwagidela m ka m hapụ gị, maọbụ ime ka m site nʼiso gị chigharịa. Aga m esoro gị gaa ebe ọbụla ị na-aga. Aga m esokwa gị biri nʼebe ọbụla ị ga-ebi; ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m, ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ, ebe ahụ kwa ka a ga-eli m. Ka ONYENWE ANYị mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m ekwere ka ihe ọzọ, ma ọ bụghị ọnwụ, kewaa mụ na gị.” Mgbe Naomi hụrụ na Rut ekpebiela nʼime onwe ya iso ya, ọ kwụsịrị ịgwa ya okwu ọzọ.