RUT 1:1-4
RUT 1:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge ndị ahụ, mgbe ndị ikpe na-achị, oke ụnwụ dara nʼala Izrel. Nʼihi ụnwụ a, otu nwoke, onye Betlehem, obodo dị na Juda, kwakọọrọ ihe ya niile, duru nwunye ya, na ụmụ ya ndị ikom abụọ, hapụ obodo ya gaa biri dịka ọbịa nʼala Moab. Aha nwoke a bụ Elimelek. Aha nwunye ya bụ Naomi, ma aha ụmụ ya ndị ikom abụọ bụ Mahlọn na Kilịọn. Ha bụ ndị Efrat si Betlehem nke dị na Juda. Ha bịarutere nʼala Moab biri nʼebe ahụ. Ma Elimelek di Naomi nwụrụ, hapụ naanị Naomi, na ụmụ ya ndị ikom abụọ. Ha lụrụ ndị nwunye site nʼetiti ndị inyom Moab. Aha nke mbụ bụ Ọpa, ebe aha nke abụọ bụ Rut. Ha biri nʼebe ahụ ihe dị ka afọ iri.
RUT 1:1-4 Bible Nso (IGBOB)
O rue, na mb͕e ndi-ikpe n=ekpe, na ok/e unwu di n>ala. Ot#u nwoke nke Bet-lehem-juda we je inọ dika ọb#ia n>ala-ọhia Moab, ya onwe-ya, na nwunye-ya, na umu-ya ndikom abua. Aha nwoke ahu bu Elimelek, aha nwunye-ya bu Naomi, aha umu-ya ndikom abua bu Mahlon na Kilion, ndi Efrat nke Bet-lehem-juda. Ha we ba n>ala-ọhia Moab, nọ n>ebe ahu. Elimelek, b/u di Naomi, we nwua; ma nwayi ahu na umu-ya ndikom abua fọduru. Ha we lutara onwe-ha nwunye sitere n>umu-ndinyom Moab; aha ot#u bu _Opa, aha nke-ọzọ bu Rut: ha we biri n>ebe ahu ihe ra ka arọ iri.