Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

RUT 1:1-17

RUT 1:1-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼoge ndị ahụ, mgbe ndị ikpe na-achị, oke ụnwụ dara nʼala Izrel. Nʼihi ụnwụ a, otu nwoke, onye Betlehem, obodo dị na Juda, kwakọọrọ ihe ya niile, duru nwunye ya, na ụmụ ya ndị ikom abụọ, hapụ obodo ya gaa biri dịka ọbịa nʼala Moab. Aha nwoke a bụ Elimelek. Aha nwunye ya bụ Naomi, ma aha ụmụ ya ndị ikom abụọ bụ Mahlọn na Kilịọn. Ha bụ ndị Efrat si Betlehem nke dị na Juda. Ha bịarutere nʼala Moab biri nʼebe ahụ. Ma Elimelek di Naomi nwụrụ, hapụ naanị Naomi, na ụmụ ya ndị ikom abụọ. Ha lụrụ ndị nwunye site nʼetiti ndị inyom Moab. Aha nke mbụ bụ Ọpa, ebe aha nke abụọ bụ Rut. Ha biri nʼebe ahụ ihe dị ka afọ iri. Mahlọn na Kilịọn mechara nwụọ. Ya mere, Naomi ghọrọ onye gba aka di, na onye gba aka ụmụ. Mgbe Naomi nọ nʼala Moab nụ na ONYENWE ANYị eletala ndị Izrel site nʼinye ha ihe oriri, Naomi na ndị nwunye ụmụ ya abụọ kwadoro ịlaghachi azụ nʼala Izrel. Ya mere, Naomi na ndị nwunye ụmụ ya abụọ hapụrụ ala Moab ebe ha bi kemgbe, malite ịgbaso ụzọ ha ga-esi laghachi nʼala Juda. Mgbe ahụ, Naomi gwara ndị nwunye ụmụ ya abụọ okwu sị ha, “Ngwa, onye ọbụla nʼime unu laghachi nʼụlọ nne ya. Ka ONYENWE ANYị gosi unu obiọma dịka unu si gosi mụ onwe m, na ndị unu nwụrụ anwụ. Ka ONYENWE ANYị nyekwa unu di ọzọ ma meekwa ka unu chọta udo nʼezinaụlọ ọzọ.” Mgbe ahụ Naomi suturu ha ọnụ, ha niile kwara akwa. Ma Ọpa na Rut zara Naomi sị ya, “E, anyị agaghị ala. Anyị ga-esoro gị laghachikwuru ndị gị.” Naomi zara sị ha, “Laghachinụ ụmụ m, ọ bụ nʼihi gịnị ka unu ga-eji soro m laa? E nwere m ike ịmụta ụmụ ndị ikom ọzọ ndị ga-abụ di unu? Laghachinụ azụ ụmụ m. Emeela m agadi ịlụ di ọzọ. A sịkwarị na olileanya fọdụụrụ m ịlụ di na ịmụta ụmụ ndị ikom nʼabalị taa, unu ga-echere ruo mgbe ha tolitere? Unu ga-anọ na-alụghị di ọzọ? Mba, ụmụ m ndị inyom, ọnọdụ m dị ilu karịa nke unu, nʼihi na ONYENWE ANYị esepụtala aka ya imegide m.” Ha welitere olu ha kwaa akwa ọzọ. Mgbe ahụ Ọpa suturu nne di ya ọnụ ma Rut kwusịrị ike nʼebe ọ nọ. Ma Naomi gwara ya sị, “Lee, nwunye nwanne di gị alaghachikwurula ndị nwe ya na chi ya niile, soro ya laa.” Ma Rut zara, “Akwagidela m ka m hapụ gị, maọbụ ime ka m site nʼiso gị chigharịa. Aga m esoro gị gaa ebe ọbụla ị na-aga. Aga m esokwa gị biri nʼebe ọbụla ị ga-ebi; ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m, ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ, ebe ahụ kwa ka a ga-eli m. Ka ONYENWE ANYị mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m ekwere ka ihe ọzọ, ma ọ bụghị ọnwụ, kewaa mụ na gị.”

RUT 1:1-17 Bible Nso (IGBOB)

O rue, na mb͕e ndi-ikpe n=ekpe, na ok/e unwu di n>ala. Ot#u nwoke nke Bet-lehem-juda we je inọ dika ọb#ia n>ala-ọhia Moab, ya onwe-ya, na nwunye-ya, na umu-ya ndikom abua. Aha nwoke ahu bu Elimelek, aha nwunye-ya bu Naomi, aha umu-ya ndikom abua bu Mahlon na Kilion, ndi Efrat nke Bet-lehem-juda. Ha we ba n>ala-ọhia Moab, nọ n>ebe ahu. Elimelek, b/u di Naomi, we nwua; ma nwayi ahu na umu-ya ndikom abua fọduru. Ha we lutara onwe-ha nwunye sitere n>umu-ndinyom Moab; aha ot#u bu _Opa, aha nke-ọzọ bu Rut: ha we biri n>ebe ahu ihe ra ka arọ iri. Mahlon na Kilion we nwu kwa, ha abua; o we fọdu n/an/i nwayi ahu site n>umu-ya abua site kwa na di-ya. O we bilie, ya onwe-ya na nwunye abua nke umu-ya, ka o we si n>ala-ọhia Moab lata: n>ihi na ọ nuru n>ala-ọhia Moab na Jehova eletawo ndi-ya n>inye ha nri. O we si n>ebe ọ nọ pua, ya na nwunye abua nke umu-ya; ha we je n>uzọ ilata n>ala Juda. Naomi we si nwunye abua nke umu-ya, Jenu, laghachi, nwayi ọ bula n>ulo nne-ya: Jehova mere unu ebere, dika unu mere ndi nwuru anwu, me-kwa-ra mu onwem. Jehova me ka unu chọta izu-ike, nwayi ọ bula n>ulo di-ya. O we sutu ha ọnu; ha we welie olu-ha kwa /akw/a. Ha we si ya, N>ezie ayi g=esoro gi laghachikuru ndi-gi. Naomi we si, Laghachinu, umum: n>#ihi gini ka unu g=esom la? #enwerem umu-ndikom ọzọ n>afọm, ka ha we buru unu di? Laghachinu, umum, lanu; n>ihi na emewom agadi kari inwe di. _O buru na asim, Enwerem olile-anya, ọ buru kwa na nwoke aluam n>abali a, ọ buru kwa na amuam umu-ndikom; #ọ bu ha ka unu g=anele anya rue mb͕e ha g=etolite? #ọ bu n>ihi ha ka unu g=eb͕ochi onwe-unu ka nwoke ghara ilu unu na nwunye? /e-#e, umum; n>ihi na ọ dim ilu nke-uku kari ka ọ di unu, n>ihi na aka Jehova aputawo imegidem. Ha we welie olu-ha, kwa /akw/a ọzọ: _Opa we sutu nne di-ya ọnu; ma Rut rapara n>aru ya. O we si, Le, nwunye nwa-nne di-gi alaghachikuruwo ndi-ya, laghachikuru chi-ya: gi soro nwunye nwa-nne di-gi laghachi. Rut we si, ariọlam irapu gi, isi n>iso gi laghachi: n>ihi na ebe i n=eje ka m>g=eje; ọ bu kwa ebe i n=anọ ọnọdu-abali ka m>g=anọ ọnọdu-abali: ndi-gi g=abu ndim, Chineke-gi g=abu kwa Chinekem: ebe i nwuru ka m>g=anwu, ọ bu kwa n>ebe ahu ka ag=el#im: Jehova mem ot/u a, mekwam ihe ọzọ ot/u a, mb͕e ihe n=abughi ọnwu onwe-ya g=ekewa mu na gi.