NDI ROM 8:5-11
NDI ROM 8:5-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị niile na-ebi ndụ ha dịka anụ ahụ siri chọọ, na-ebi ya naanị imezu agụụ niile na-agụ anụ ahụ ha. Ma ndị niile na-agbaso ụzọ nke Mmụọ na-achọpụta na ha na-eme ihe Mmụọ na-achọ. Ịtụkwasị uche nʼihe nke anụ ahụ na-eweta ọnwụ. Ma ịtụkwasị uche nʼihe nke Mmụọ Nsọ na-eweta ndụ na udo. Nʼihi na onye ọbụla tụkwasịrị uche ya nʼihe nke anụ ahụ na-ebuso Chineke agha, ọ naghị edebe iwu nke Chineke. Nʼeziokwu, ọ gaghị enwe ike idebe ya. Ya mere, ndị na-erubere anụ ahụ ha isi apụghị ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Ma lee! Unu onwe unu anaghị ebizi ndụ nʼusoro nke anụ ahụ, kama unu na-ebi nʼusoro nke Mmụọ Nsọ nʼihi na Mmụọ nke Chineke bi nʼime unu. Onye ọbụla na-enweghị Mmụọ nke Kraịst abụghị nke ya. Ọ bụrụkwa na Kraịst bi nʼime unu, anụ ahụ unu ga-abụ ihe nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị, ma mmụọ unu dị ndụ nʼihi na a gụọla unu na ndị ezi omume. Ọ bụrụ na Mmụọ onye mere ka Jisọs si nʼọnwụ bilie, bi nʼime gị, onye ahụ nke mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie ga-emekwa ka anụ ahụ gị dị ndụ site nʼike Mmụọ Nsọ ahụ, onye bi nʼime gị.
NDI ROM 8:5-11 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na ndi di ka anu-aru si chọ nātukwasi uche n'ihe nke anu-aru; ma ndi di ka Mọ Nsọ si chọ nātukwasi uche n'ihe nke Mọ Nsọ. N'ihi na itukwasi uche n'anu-aru bu ọnwu; ma itukwasi uche na Mọ Nsọ bu ndu na udo: n'ihi na itukwasi uche n'anu-aru, ya na Chineke di n'iro; n'ihi na edoghi ya n'okpuru iwu Chineke, n'ihi na apughi kwa ido ya n'okpuru ya: ndi nke nọ n'anu-aru apughi kwa itọ Chineke utọ. Ma unu onwe-unu anọghi n'anu-aru, kama unu nọ nime Mọ Nsọ, ma ọ buru na ọbu ezie na Mọ nke Chineke nēbi nime unu. Ma ọ buru na onye ọ bula enweghi Mọ nke Kraist, onye ahu abughi nke Ya. Ma ọ buru na Kraist nọ nime unu, aru-unu bu ihe nwuru anwu n'ihi nmehie n'ezie; ma Mọ Nsọ bu ndu n'ihi ezi omume. Ma ọ buru na Mọ nke Onye ahu Nke mere ka Jisus si na ndi nwuru anwu bilie nēbi nime unu, Onye ahu Nke mere ka Kraist Jisus si na ndi nwuru anwu bilie gēsite kwa n'aka Mọ-Ya Nke nēbi nime unu me ka aru-unu nke puru inwu anwu di ndu.