NDI ROM 8:31-37
NDI ROM 8:31-37 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. Ọ bụrụ na Chineke nọnyere anyị, onye pụrụ imegide anyị? Onye ahụ na-azọghị ndụ Ọkpara ya, kama o weere ya nye nʼihi mmehie anyị niile, ọ dị ihe ọzọ anyị chọrọ ọ na-agaghị enye anyị site na ya? Onye pụrụ ibo ndị ahụ Chineke họpụtara ebubo? Ọ bụ Chineke na-agụ mmadụ dịka onye ezi omume. Onye bụ onye ahụ nke ga-ama ikpe? Ọ bụ Kraịst Jisọs onye nwụrụ, ma karịa nke ahụ, onye e mere ka o si nʼọnwụ bilie, nọ nʼaka nri Chineke na-arịọtakwara anyị arịrịọ. Onye nwere ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Kraịst? Ọ bụ nsogbu, ka ọ bụ ihe isi ike, ka ọ bụ mkpagbu. Ka ọ bụ ụnwụ, ka ọ bụ ịgba ọtọ, ka ọ bụ ihe egwu, ka ọ bụ mma agha? Dịka e dere ya, “Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.” Mba, kama nʼime ihe ndị a niile, anyị karịrị ndị mmeri site nʼonye ahụ hụrụ anyị nʼanya.
NDI ROM 8:31-37 Bible Nso (IGBOB)
Gini kwa ka ayi gēkwu n'ile ihe ndia anya? Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi? Onye ahu Nke nāzọdoghi Ọkpara nke aka Ya, kama Ọ rara Ya nye n'ihi ayi nile, Ò gēsi aṅa ghara inye kwa ayi ihe nile n'amara ebe O weresiri Onye ahu nye ayi? Ònye gēbo ndi Chineke rọputara ebubo? Ọ̀ bu Chineke Onye nāgu ha na ndi ezi omume? Ònye bu onye ahu nke gāma ikpé? Ọ̀ bu Kraist Jisus Onye nwuru, ma nke kariri, emere Ya ka O si na ndi nwuru anwu bilie, Onye nọ n'aka-nri Chineke, Onye nāriọ-kwa-ra ayi aririọ? Ònye gēkewapu ayi n'ihu-n'anya nke Kraist? Ọ̀ bu nkpab͕u, ma-ọbu oké nkpà, ma-ọbu nsob͕u, ma-ọbu oké unwu, ma-ọbu ib͕a-ọtọ, ma-ọbu ize-ndu, ma-ọbu mma-agha? Dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, N'ihi Gi ka anēme ka ayi nwua ogologo ubọchi dum; Aguru ayi dika aturu ob͕ub͕u. É-è, kama n'ihe ndia nile ayi nēmeribiga ókè site n'aka Onye ahu Nke huru ayi n'anya.