NDI ROM 8:26-31
NDI ROM 8:26-31 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu aka ahụ, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nʼime adịghị ike anyị. Nʼihi na anyị amaghị ka esi ekpe ekpere dịka o kwesiri. Ma Mmụọ Nsọ nʼonwe ya ji ịsụ ude nke ọnụ apụghị ịkọ na-arịọrọ anyị arịrịọ. Chineke, onye na-enyocha obi mmadụ, amarala ihe Mmụọ Nsọ bụ nʼuche. Nʼihi na Mmụọ Nsọ na-arịọrọ ndị nsọ niile arịrịọ dịka Chineke si chọọ. Anyị maara na ihe niile na-arụkọta ọrụ maka ọdịmma ndị hụrụ Chineke nʼanya bụ ndị a kpọrọ dịka uche nsọ ya siri dị. Nʼihi na ndị ahụ ọ maararị ka ọ kakwara akara ka ha nwe ụdịdị nke Ọkpara ya, ka ọ bụrụ nwa e buru ụzọ mụọ nʼetiti ọtụtụ ụmụnna. Ma ndị ahụ ọ kara akara, ka ọ kpọkwara; ndị ọ kpọrọ, ka ọ gụrụ na ndị ezi omume; ndị ọ gụrụ na ndị ezi omume ka o nyekwara otuto. Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. Ọ bụrụ na Chineke nọnyere anyị, onye pụrụ imegide anyị?
NDI ROM 8:26-31 Bible Nso (IGBOB)
Otù ahu Mọ Nsọ nēye-kwa-ra adighi-ike-ayi aka: n'ihi na ayi amataghi ihe ayi gēkpe n'ekpere dika ayi nāghaghi ikpe; kama ọ bu Mọ Nsọ onwe-ya were isu-udè anāpughi ikwu nāriọrọ ayi aririọ; ma Onye ahu Nke nēnyocha obi-ayi matara ihe Mọ Nsọ nātukwasi uche na ya, n'ihi na Ọ nāriọrọ ndi nsọ aririọ dika Chineke si chọ. Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di. N'ihi na ndi O buru uzọ mara, O bu-kwa-ra uzọ ka ha àkà, ka ha na onyinyo nke Ọkpara-Ya nwekọ otù udi, ka O we buru onye ebu uzọ mu n'etiti ọtutu umu-nna: ma ndi O buru uzọ ka àkà, ndia ka Ọ kpọ-kwa-ra: ma ndi Ọ kpọrọ, ndia ka Ọ gu-kwa-ra na ndi ezi omume: ma ndi Ọ guru na ndi ezi omume, ndia ka O nye-kwa-ra otuto. Gini kwa ka ayi gēkwu n'ile ihe ndia anya? Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi?