NDI ROM 8:18-23
NDI ROM 8:18-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼikwu eziokwu, ahụhụ niile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ebube niile a ga-ekpughe nʼime anyị. Ihe niile e kere eke ji oke agụụ na-eche mgbe a ga-egosipụta ndị bụ ụmụ Chineke. Nʼihi na e tinyere ihe e kere eke nʼọnọdụ ihe na-abaghị uru, ma ọ bụghị site nʼọchịchọ nke onwe ya, kama nʼọchịchọ nke onye ahụ tinyere ya nʼọnọdụ ahụ nʼime olileanya, na otu ụbọchị na ha ga-enwere onwe ha site nʼagbụ nke ire ure, sorokwa keta oke nʼebube ahụ ga-abụ nke ụmụ Chineke. Anyị maara na ruo ugbu a, ihe niile e kere eke na-asụ ude nʼihi ihe mgbu ha nọ nʼime ya, dịka ihe mgbu nke ọmụmụ nwa. Ọ bụghị naanị nke a, ma anyị onwe anyị, ndị nwere mkpụrụ mbụ nke Mmụọ Nsọ, na-asụkwa ude nʼime onwe anyị, na-echesi ike mgbe a ga-akpọbata anyị dịka ụmụ, mgbe a ga-agbapụta anụ ahụ anyị.
NDI ROM 8:18-23 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na anamagu na ahuhu nile nke oge di ub͕u a ekwesighi ka ekwuta ha ma ele ebube ahu anya, bú nke agaje ikpughe n'ebe ayi nọ. N'ihi na olile-anya siri ike nke ihe nile ekère èkè nēchesi nkpughe nke umu-ndikom Chineke ike. N'ihi na edoro ihe ahu ekèrè èkè n'okpuru ihe-efu, ọ bughi na ọ chọrọ ya, kama n'ihi Onye ahu Nke doro ya n'okpuru ya n'olile-anya; n'ihi na agēme ka ihe ekère èkè onwe-ya pu kwa n'ibu-orù nmebi ba n'ọnọdu inwe-onwe-ya nke ebube nke umu Chineke. N'ihi na ayi matara na ihe ekère èkè nile nāsukọ udè, ime nēmekọ kwa ha, rue ub͕u a. Ma ọ bughi nání nka, kama ayi onwe-ayi, ndi nwere nkpuru mbu nke Mọ Nsọ, ọbuná ayi onwe-ayi nāsu kwa udè nime onwe-ayi, mb͕e ayi nēchesi ido-ka-nwa-nwoke ahu ike, bú nb͕aputa nke aru-ayi.