Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI ROM 8:14-39

NDI ROM 8:14-39 Bible Nso (IGBOB)

N'ihi na ka ha ra, bú ndi Mọ Chineke nēdú, ndi ahu bu umu-ndikom Chineke. N'ihi na unu anataghi mọ nke ibu-orù ilaghachi n'egwù ọzọ; kama unu natara Mọ nke ido-ka-nwa-nwoke, Nke ayi nēti nkpu nime Ya, si, Aba, Nna. Mọ Nsọ onwe-ya soro mọ-ayi nāb͕a àmà, na ayi bu umu Chineke: ma ọ buru na ayi bu umu, ayi bu kwa ndi-nketa; ndi-nketa nke Chineke, na ndi ha na Kraist nēkekọ; ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi na Ya nāhukọ ahuhu, ka ewe nyekọ kwa ayi na Ya otuto. N'ihi na anamagu na ahuhu nile nke oge di ub͕u a ekwesighi ka ekwuta ha ma ele ebube ahu anya, bú nke agaje ikpughe n'ebe ayi nọ. N'ihi na olile-anya siri ike nke ihe nile ekère èkè nēchesi nkpughe nke umu-ndikom Chineke ike. N'ihi na edoro ihe ahu ekèrè èkè n'okpuru ihe-efu, ọ bughi na ọ chọrọ ya, kama n'ihi Onye ahu Nke doro ya n'okpuru ya n'olile-anya; n'ihi na agēme ka ihe ekère èkè onwe-ya pu kwa n'ibu-orù nmebi ba n'ọnọdu inwe-onwe-ya nke ebube nke umu Chineke. N'ihi na ayi matara na ihe ekère èkè nile nāsukọ udè, ime nēmekọ kwa ha, rue ub͕u a. Ma ọ bughi nání nka, kama ayi onwe-ayi, ndi nwere nkpuru mbu nke Mọ Nsọ, ọbuná ayi onwe-ayi nāsu kwa udè nime onwe-ayi, mb͕e ayi nēchesi ido-ka-nwa-nwoke ahu ike, bú nb͕aputa nke aru-ayi. N'ihi na ọ bu n'olile-anya ka azọputara ayi: ma olile-anya nke anāhu anya abughi olile-anya: n'ihi na ihe madu nāhu anya, gini mere o ji nēle anya ya? Ma ọ buru na ayi nēle anya ihe ayi nāhughi anya, ayi ji ntachi-obi nēchesi ya ike. Otù ahu Mọ Nsọ nēye-kwa-ra adighi-ike-ayi aka: n'ihi na ayi amataghi ihe ayi gēkpe n'ekpere dika ayi nāghaghi ikpe; kama ọ bu Mọ Nsọ onwe-ya were isu-udè anāpughi ikwu nāriọrọ ayi aririọ; ma Onye ahu Nke nēnyocha obi-ayi matara ihe Mọ Nsọ nātukwasi uche na ya, n'ihi na Ọ nāriọrọ ndi nsọ aririọ dika Chineke si chọ. Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di. N'ihi na ndi O buru uzọ mara, O bu-kwa-ra uzọ ka ha àkà, ka ha na onyinyo nke Ọkpara-Ya nwekọ otù udi, ka O we buru onye ebu uzọ mu n'etiti ọtutu umu-nna: ma ndi O buru uzọ ka àkà, ndia ka Ọ kpọ-kwa-ra: ma ndi Ọ kpọrọ, ndia ka Ọ gu-kwa-ra na ndi ezi omume: ma ndi Ọ guru na ndi ezi omume, ndia ka O nye-kwa-ra otuto. Gini kwa ka ayi gēkwu n'ile ihe ndia anya? Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi? Onye ahu Nke nāzọdoghi Ọkpara nke aka Ya, kama Ọ rara Ya nye n'ihi ayi nile, Ò gēsi aṅa ghara inye kwa ayi ihe nile n'amara ebe O weresiri Onye ahu nye ayi? Ònye gēbo ndi Chineke rọputara ebubo? Ọ̀ bu Chineke Onye nāgu ha na ndi ezi omume? Ònye bu onye ahu nke gāma ikpé? Ọ̀ bu Kraist Jisus Onye nwuru, ma nke kariri, emere Ya ka O si na ndi nwuru anwu bilie, Onye nọ n'aka-nri Chineke, Onye nāriọ-kwa-ra ayi aririọ? Ònye gēkewapu ayi n'ihu-n'anya nke Kraist? Ọ̀ bu nkpab͕u, ma-ọbu oké nkpà, ma-ọbu nsob͕u, ma-ọbu oké unwu, ma-ọbu ib͕a-ọtọ, ma-ọbu ize-ndu, ma-ọbu mma-agha? Dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, N'ihi Gi ka anēme ka ayi nwua ogologo ubọchi dum; Aguru ayi dika aturu ob͕ub͕u. É-è, kama n'ihe ndia nile ayi nēmeribiga ókè site n'aka Onye ahu Nke huru ayi n'anya. N'ihi na emewo ka m'kweye, na ọnwu, ma-ọbu ndu, ma-ọbu ndi-mọ-ozi, ma-ọbu ibu-isi di iche iche, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi, ma-ọbu ike di iche iche, ma-ọbu ihe di elu, ma-ọbu ihe di omimi, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ ekère èkè, agaghi-apu ikewapu ayi n'ihu-n'anya Chineke, nke di nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.

NDI ROM 8:14-39 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼihi na ndị niile Mmụọ nke Chineke na-achị bụ ụmụ Chineke. Nʼihi na unu anataghị mmụọ nke na-eme unu ndị ohu ọzọ nye ịtụ ụjọ, kama unu natara Mmụọ nke mere unu ụmụ Chineke. Ọ bụ site na Mmụọ ahụ ka anyị ji na-akpọ “Abba, Nna.” Mmụọ Nsọ, nʼonwe ya na-agbakwa ama nʼime mmụọ anyị, na-agwa anyị na anyị bụ ụmụ Chineke. Ugbu a, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, ọ pụtara na anyị bụ ndị nketa oke, ndị ga-eketa ihe Chineke nwere, na ndị ha na Kraịst ga-ekekọta ihe, ma ọ bụrụ nʼezie na anyị ga-esoro ya keta oke ahụhụ ya, ka anyị si otu a sorokwa ya keta oke nʼebube ya. Nʼikwu eziokwu, ahụhụ niile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ebube niile a ga-ekpughe nʼime anyị. Ihe niile e kere eke ji oke agụụ na-eche mgbe a ga-egosipụta ndị bụ ụmụ Chineke. Nʼihi na e tinyere ihe e kere eke nʼọnọdụ ihe na-abaghị uru, ma ọ bụghị site nʼọchịchọ nke onwe ya, kama nʼọchịchọ nke onye ahụ tinyere ya nʼọnọdụ ahụ nʼime olileanya, na otu ụbọchị na ha ga-enwere onwe ha site nʼagbụ nke ire ure, sorokwa keta oke nʼebube ahụ ga-abụ nke ụmụ Chineke. Anyị maara na ruo ugbu a, ihe niile e kere eke na-asụ ude nʼihi ihe mgbu ha nọ nʼime ya, dịka ihe mgbu nke ọmụmụ nwa. Ọ bụghị naanị nke a, ma anyị onwe anyị, ndị nwere mkpụrụ mbụ nke Mmụọ Nsọ, na-asụkwa ude nʼime onwe anyị, na-echesi ike mgbe a ga-akpọbata anyị dịka ụmụ, mgbe a ga-agbapụta anụ ahụ anyị. Nʼihi na a zọpụtara anyị site nʼolileanya dị otu a. Ma olileanya a na-ahụ anya abụghị olileanya. Onye na-enwe olileanya mgbe ihe ọ na-ele anya ya dị ya nʼaka? Ma ọ bụrụ na olileanya anyị dabeere nʼihe ahụ anyị na-enwetabeghị, anyị ga-eji ndidi chere tutu ihe ahụ erute anyị aka. Otu aka ahụ, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nʼime adịghị ike anyị. Nʼihi na anyị amaghị ka esi ekpe ekpere dịka o kwesiri. Ma Mmụọ Nsọ nʼonwe ya ji ịsụ ude nke ọnụ apụghị ịkọ na-arịọrọ anyị arịrịọ. Chineke, onye na-enyocha obi mmadụ, amarala ihe Mmụọ Nsọ bụ nʼuche. Nʼihi na Mmụọ Nsọ na-arịọrọ ndị nsọ niile arịrịọ dịka Chineke si chọọ. Anyị maara na ihe niile na-arụkọta ọrụ maka ọdịmma ndị hụrụ Chineke nʼanya bụ ndị a kpọrọ dịka uche nsọ ya siri dị. Nʼihi na ndị ahụ ọ maararị ka ọ kakwara akara ka ha nwe ụdịdị nke Ọkpara ya, ka ọ bụrụ nwa e buru ụzọ mụọ nʼetiti ọtụtụ ụmụnna. Ma ndị ahụ ọ kara akara, ka ọ kpọkwara; ndị ọ kpọrọ, ka ọ gụrụ na ndị ezi omume; ndị ọ gụrụ na ndị ezi omume ka o nyekwara otuto. Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. Ọ bụrụ na Chineke nọnyere anyị, onye pụrụ imegide anyị? Onye ahụ na-azọghị ndụ Ọkpara ya, kama o weere ya nye nʼihi mmehie anyị niile, ọ dị ihe ọzọ anyị chọrọ ọ na-agaghị enye anyị site na ya? Onye pụrụ ibo ndị ahụ Chineke họpụtara ebubo? Ọ bụ Chineke na-agụ mmadụ dịka onye ezi omume. Onye bụ onye ahụ nke ga-ama ikpe? Ọ bụ Kraịst Jisọs onye nwụrụ, ma karịa nke ahụ, onye e mere ka o si nʼọnwụ bilie, nọ nʼaka nri Chineke na-arịọtakwara anyị arịrịọ. Onye nwere ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Kraịst? Ọ bụ nsogbu, ka ọ bụ ihe isi ike, ka ọ bụ mkpagbu. Ka ọ bụ ụnwụ, ka ọ bụ ịgba ọtọ, ka ọ bụ ihe egwu, ka ọ bụ mma agha? Dịka e dere ya, “Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.” Mba, kama nʼime ihe ndị a niile, anyị karịrị ndị mmeri site nʼonye ahụ hụrụ anyị nʼanya. Nʼihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, na ọnwụ, maọbụ ndụ, maọbụ ndị mmụọ ozi, maọbụ mmụọ dị iche iche ndị na-achị nʼelu na nʼụwa, maọbụ ike ọchịchịrị dị iche iche, maọbụ ihe dị ugbu a, maọbụ ihe gaje ịbịa, maọbụ ịdị elu, maọbụ ịdị omimi, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ e kere eke, agaghị enwe ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Chineke, nke dị nʼime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.