NDI ROM 7:1-3
NDI ROM 7:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ na unu amaghị ụmụnna m, unu ndị maara iwu nke ọma na ọ bụ oge mmadụ dị ndụ ka iwu na-ejide ya? Dịka ihe ịmaatụ, iwu na-ejikọta nwanyị lụrụ di na di ya mgbe di ya ka nọ ndụ, ma ọ bụrụ na di nwanyị ahụ anwụọ, ọ nọkwaghị nʼokpuru iwu jikọtara ha dịka di na nwunye. A ga-akpọ ya nwanyị na-akwa iko ma ọ bụrụ na ọ lakwuru nwoke ọzọ mgbe di ya ka dị ndụ. Ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼiwu ahụ. Ọ kwaghị iko ma ọ bụrụ na ọ lụọ nwoke ọzọ.
NDI ROM 7:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Ma-ọbu ùnu amaghi, umu-nnam (n'ihi na anamagwa ndi mara iwu okwu), na iwu bu onye-nwe madu ka oge ra ọ nādi ndu? N'ihi na iwu kekọrọ nwanyi nke nwere di n'aru di-ya mb͕e di-ya nọ na ndu; ma ọ buru na di-ya nwuru, atọpuwo ya n'iwu nke di-ya. Ya mere otú a, agākpọ ya nwanyi nākwa iko, ma ọ buru na ọ lakuru nwoke di iche mb͕e di-ya nọ na ndu: ma ọ buru na di-ya nwuru, ọ puwo n'iwu nwere onwe-ya, nke nēme ya ka ọ ghara ibu nwanyi nākwa iko, ma ọ buru na ọ lakuru nwoke di iche.