Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI ROM 6:1-23

NDI ROM 6:1-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Gịnị ọzọkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-anọgide nʼime mmehie ka amara na-aba ụba? E e! O kwesighị! Olee otu anyị ga-esi na-adị ndụ nʼime mmehie, mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị? Ọ bụ na unu amataghị na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtakwara anyị na ya nʼọnwụ. Ya mere, esitere na baptizim likọọ anyị na ya nʼọnwụ, dịka e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie nʼebube nke Nna, ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ. Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nʼọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nʼọnwụ. Nʼihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ nke ochie anyị na Kraịst nʼelu obe, iji mee ka anụ ahụ nke mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nʼiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nʼịbụ ohu nke mmehie. Nʼihi na onye nwụrụ anwụ agụọla ya dịka onye nwere onwe ya site nʼebe mmehie dị. Ọ bụrụkwa nʼeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ. Nʼihi na anyị maara na ebe e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọbụla nʼebe ọ nọ ọzọ. Ọ nwụrụ naanị otu mgbe nʼihi mmehie. Ma ndụ ọ na-adị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke. Ya mere, gụọ onwe unu ugbu a dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dịka ndị dị ndụ nʼebe Chineke nọ nʼime Kraịst, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị. Unu ekwela ka mmehie na-achị eze nʼahụ unu ọzọ, nke ga-eme ka unu na-erubere agụụ nke anụ ahụ isi. Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi nʼọnwụ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume. Nʼihi na unu ekwesighị ị bụ ohu mmehie, ebe ọ bụ na unu anọkwaghị nʼokpuru iwu ọzọ, kama unu nọ nʼokpuru amara. Gịnịkwa? Anyị ga-eme mmehie nʼihi na anyị anọghị nʼokpuru iwu kama nʼokpuru amara? Mba! O kwesighị. Ọ bụ na unu amataghị na mgbe unu weere onwe unu nye mmadụ irubere ya isi dịka ohu, unu bụ ohu nye onye ahụ unu na-erubere isi, maọbụ ohu nye mmehie nke na-eduba nʼọnwụ, ma ọ bụkwanụ irube isi nke na-eduba nʼezi omume? Ma ekele dịrị Chineke nʼihi na ọ bụ ezie na unu bụrịị ohu nye mmehie, ma ugbu a, unu ejirila obi unu niile kpebie ịnabatara onwe unu ozizi ahụ e nyefere nʼaka unu. Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie, unu abụrụla ndị ohu ezi omume. Ana m eji ihe ịmaatụ site na ndụ a na-ebi kwa ụbọchị, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ mmadụ. Ya mere, dịka unu si were ahụ unu dị iche iche nye ịbụ ohu adịghị ọcha na ajọ omume nke na-abawanye ụba, sitekwanụ otu a were ha nye ugbu a ka ha bụrụ ohu ezi omume nke na-eduba nʼịdị nsọ. Mgbe unu bụ ohu mmehie, o nweghị ihe megidere unu ime ezi omume. Ma gịnị bụ uru unu nwetara nʼoge ahụ site nʼọrụ ahụ niile unu rụrụ, bụ ihe ndị ahụ na-eme ka ihere mee unu? Ihe ndị ahụ na-eduba nʼọnwụ. Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie. Unu aghọọla ndị ohu Chineke. Uru unu na-erita bụ ịdị nsọ, ọgwụgwụ ya bụkwa ndụ ebighị ebi. Nʼihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nʼefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.

NDI ROM 6:1-23 Bible Nso (IGBOB)

Gini ka ayi gēkwu kwa? Àyi gānọgide na nmehie, ka amara we rie nne? Chineke ekwela. Ayi onwe-ayi, bú ndi nwuru n'ebe nmehie di, àyi gēsi aṅa nādi ndu ọzọ nime ya? Ma-ọbu ùnu amaghi na ka ayi-ra, bú ndi emere baptism iba nime Kraist Jisus, emere ayi baptism ibà n'ọnwu-Ya? Ya mere esitere na baptism-ayi likọ ayi na Ya ibà n'ọnwu ahu: ka, dika esitere n'ebube nke Nna-Ya me ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi onwe-ayi we jeghari kwa na ndu ọhu otú a. N'ihi na asi na ejiri oyiyi ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe, agēji kwa oyiyi nke nbilite-n'ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe; ebe ayi mara nka, na akpọgidekọrọ Ya na madu ochie ayi n'obe, ka ewe me ka aru-ayi nke nmehie nwezu ghara idi irè, ka ayi we ghara idi nābu orù nke nmehie ọzọ; n'ihi na onye nwuru anwu, aguwo ya o'nye ezi omume pua na nmehie-ya. Ma ọ buru na ayi na Kraist nwukọrọ, ayi kwere na ayi na Ya gādikọ kwa ndu ọzọ; n'ihi na ayi matara na ebe emere ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie Ọ gaghi-anwu ọzọ; ọnwu abughi kwa onye nēnwe Ya ọzọ. N'ihi na ọnwu Ọ nwuru, Ọ nwuru nání otù ọnwu n'ebe nmehie di: ma ndu Ọ nādi, Ọ nādi n'ebe Chineke nọ. Otú a unu onwe-unu, nāgu-kwa-nu na unu onwe-unu bu ndi nwuru anwu n'ebe nmehie di, ma na unu nādi ndu nime Kraist Jisus n'ebe Chineke nọ. Ya mere, ka nmehie ghara idi nābu eze n'aru-unu nke puru inwu anwu, ime unu ka unu ṅa agu-ya nile nti: unu adi-kwa-la nēche ihe di unu n'aru n'iru nmehie ka ha buru ihe-agha ajọ omume; kama chenu onwe-unu n'iru Chineke, dika ndi sitere na ndi nwuru anwu di ndu, che-kwa-nu ihe di unu n'aru n'iru Chineke ka ha buru ihe-agha ezi omume. N'ihi na nmehie agaghi-abu onye-nwe-unu: n'ihi na unu anọghi n'okpuru iwu, kama n'okpuru amara. Gini kwa? ọ̀ bu na ayi gēmehie, n'ihi na ayi anọghi n'okpuru iwu, kama n'okpuru amara? Chineke ekwela. Ùnu amataghi na onye unu nēche onwe-unu n'iru ya ka unu buru ndi-orù iṅa ya nti, unu bu ndi-orù nke onye ahu unu nāṅa nti ya; ma-ọbu nke nmehie nēweta ọnwu, ma-ọ̀bu nke iṅa-nti nēweta ezi omume? Ma ekele diri Chineke, na unu buri ndi-orù nke nmehie, ma unu sitere n'obi-unu ṅa nti ihe-atù nke ozizi ahu nke arara unu nye n'aka-ya; ebe eme-kwa-ra ka unu pua na nmehie nwere onwe-unu, unu ghọrọ ndi-orù nke ezi omume. Anamekwu dika madu n'ihi adighi-ike nke anu-aru-unu: n'ihi na dika unu chere ihe nile di unu n'aru n'iru adighi-ọcha na n'iru imebi-iwu nēdubà n'imebi-iwu ka unu buru ndi-orù-ha, otú a chenu ihe nile di unu n'aru n'iru ezi omume ub͕u a, bú nke nēdubà n'ido-nsọ, ka unu buru ndi-orù-ya. N'ihi na mb͕e unu bu ndi-orù nke nmehie, unu nwere onwe-unu n'ebe ezi omume di. Ọ̀ bu nkpuru gini kwa ka unu nwere n'oge ahu n'ihe nile ahu nke ihere ha nēme unu ub͕u a? n'ihi na ọgwugwu ihe nile ahu bu ọnwu. Ma ub͕u a ebe unu pusiri na nmehie nwere onwe-unu, ghọ kwa ndi-orù nke Chineke, unu nwere nkpuru-unu nēweta ido-nsọ, unu nwe-kwa-ra ndu ebighi-ebi dika ọgwugwu-ya. N'ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebighi-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.