NDI ROM 5:2-4
NDI ROM 5:2-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye anyị sitere nʼaka ya nata amara nke anyị na-eguzo nʼime ya ugbu a. Anyị nọ nʼọṅụ nweekwa olileanya na a ga-eme ka anyị keta oke nʼebube Chineke. Ọ bụkwaghị naanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼime nsogbu anyị niile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachiobi. Ntachiobi na-arụpụta nʼime anyị ezi agwa; ezi agwa na-arụpụtakwa olileanya.
Kesaa
Gụọ NDI ROM 5NDI ROM 5:2-4 Bible Nso (IGBOB)
Onye ayi sitewo-kwa-ra n'aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n'okwukwe-ayi nime amara nka ayi nēguzo nime ya; ayi nānya kwa isi, nādabere n'olile-anya nke otuto Chineke. Ma ọ bughi nání nka, kama ayi nānya kwa isi nime nkpab͕u-ayi nile: ebe ayi matara na nkpab͕u nāluta ntachi-obi; ntachi-obi ahu nāluta kwa ọnwunwa; ọnwunwa ahu nāluta kwa olile-anya
Kesaa
Gụọ NDI ROM 5