NDI ROM 5:18-21
NDI ROM 5:18-21 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere otú a, dika ikpé ahu sitere n'otù ndahie bia rue madu nile iwetara ha amam-ikpe; ọbuná otú a ka onyinye-amara ahu sitere n'otù ọlu ezi omume bia rue madu nile igu ha na ndi ezi omume ka ha nata ndu. N'ihi na dika edoro ọra madu na ndi-nmehie site n'aṅaghi-nti nke otù madu ahu, ọbuná otú a ka agēdo ọra madu na ndi ezi omume site n'iṅa-nti nke otù Onye ahu. Iwu we b͕ebà, ka ndahie ahu we rie nne; ma n'ebe nmehie riri nne, n'ebe ahu ka amara babigara ókè nke-uku kari: ma, dika nmehie si buru eze n'onwu, ka amara we buru kwa eze otú a site n'ezi omume rue ndu ebighi-ebi site n'aka Jisus Kraist Onye-nwe-ayi.
NDI ROM 5:18-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, dịka otu njehie si weta ikpe ọmụma nye mmadụ niile, otu ahụ kwa ka e si gụọ mmadụ niile dịka ndị ezi omume na ndị nwere ndụ site nʼotu ọrụ ezi omume. Nʼihi na dịka ọtụtụ mmadụ si bụrụ ndị mmehie nʼihi nnupu isi nke otu nwoke, otu a kwa ka ọtụtụ mmadụ ga-abụkwa ndị ezi omume nʼihi nrube isi nke otu nwoke. Iwu bịara mee ka mmehie na-aba ụba, ma dịka mmehie na-aba ụba, amara na-abakwa ụba karịa. Ya mere, dịka mmehie si bụrụ eze nʼọnwụ, otu a kwa ka amara ga-esi bụrụ eze site nʼezi omume iweta ndụ ebighị ebi site nʼaka Jisọs Kraịst, Onyenwe anyị.