NDI ROM 5:16-18
NDI ROM 5:16-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọzọ, onyinye a adịghị ka ihe mmehie mmadụ mụpụtara. Nʼihi na ikpe ahụ sooro mmehie otu onye weta ọmụma ikpe, ma onyinye ahụ sooro ọtụtụ njehie weta ịgụ mmadụ nʼonye ikpe na-amaghị. Ya mere, ọ bụrụ na ọnwụ chịrị ọchịchị site na njehie nke otu onye, ọ bụghị ihe dị ukwu karịa na ndị nabatara onyinye amara Chineke bara ụba, ya na onyinye ezi omume, ga-achị achị na ndụ site nʼotu onye ahụ bụ Jisọs Kraịst. Ya mere, dịka otu njehie si weta ikpe ọmụma nye mmadụ niile, otu ahụ kwa ka e si gụọ mmadụ niile dịka ndị ezi omume na ndị nwere ndụ site nʼotu ọrụ ezi omume.
NDI ROM 5:16-18 Bible Nso (IGBOB)
Onyinye ahu abughi kwa dika o sitere n'aka otù onye nke mehiere: n'ihi na ikpé sitere n'otù onye bia weta amam-ikpe, ma onyinye-amara ahu sitere n'ọtutu ndahie bia weta ọlu igu madu na ndi ezi omume. N'ihi na asi na ọnwu si n'aka otù onye ahu buru eze, site na ndahie nke otù onye ahu; ndi nānata nbabiga-ókè nke amara ahu na nke onyinye ahu, bú ezi omume, gābu kari eze ri nne na ndu site n'aka otù Onye ahu, bú Jisus Kraist. Ya mere otú a, dika ikpé ahu sitere n'otù ndahie bia rue madu nile iwetara ha amam-ikpe; ọbuná otú a ka onyinye-amara ahu sitere n'otù ọlu ezi omume bia rue madu nile igu ha na ndi ezi omume ka ha nata ndu.