NDI ROM 4:20-25
NDI ROM 4:20-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ dịghị mgbe ọbụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe niile o kwere ya na nkwa. Kama, okwukwe ya mere ka ọ gbasie ike, ka ọ na-enye Chineke otuto. O nwere otu obi na Chineke pụrụ imezu ihe niile ọbụla o kwere na nkwa. Ọ bụ nʼihi ya ka e ji gụọ nke a nye ya dị ka ezi omume. Okwu ndị a, “A gụrụ ya nye ya dịka onye ezi omume,” edeghị ya naanị maka ya. Kama e dere ya nʼihi anyị bụ ndị kwere nʼonye ahụ mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie. Onye a rara nye ka ọ nwụọ nʼihi mmehie anyị niile, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie ka anyị bụrụ ndị a gụrụ dịka ndị ezi omume.
NDI ROM 4:20-25 Bible Nso (IGBOB)
o jighi kwa ekweghi-ekwe nwe obi abua n'ebe nkwa Chineke di, kama ejiri okwukwe-ya me ka o nwe ike, ọ nēnye kwa Chineke otuto, nēkwezu kwa na ihe O kwereri na nkwa, Ọ puru ime kwa. N'ihi ya agu-kwa-ra ya nye ya dika ezi omume. Ma ọ bughi n'ihi nání ya ka edeworo ya n'akwukwọ nsọ, na aguru ya nye ya; kama ọ bu kwa n'ihi ayi, ndi agaje igu ya nye ayi, ndi kwere n'Onye ahu Nke mere ka Jisus Onye-nwe-ayi si na ndi nwuru anwu bilie, Onye arara Ya nye n'ihi ndahie-ayi nile, ewe me ka O si n'ọnwu bilie n'ihi igu ayi na ndi ezi omume.