NDI ROM 4:17-21
NDI ROM 4:17-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Dịka e dere ya, “Emeela m gị nna nke ọtụtụ mba.” Ya mere, nʼihu Chineke ahụ bụ onye o kweenyere nʼime ya, bụ onye ahụ na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịkwa ndụ ọzọ, onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịbụghị, mee ka ha dịrị. Ọ bụladị mgbe olileanya gasịrị, o kwenyere na ya ga-abụ nna nke ọtụtụ mba, dịka ihe a gwara ya si dị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị.” Ọ daghị mba nʼokwukwe ọ bụladị mgbe ọ matara na ya akala nka nʼahụ, nʼihi na ọ gbaruola otu narị afọ, tinyekwara na akpanwa Sera bụ ihe nwụrụ anwụ. Ọ dịghị mgbe ọbụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe niile o kwere ya na nkwa. Kama, okwukwe ya mere ka ọ gbasie ike, ka ọ na-enye Chineke otuto. O nwere otu obi na Chineke pụrụ imezu ihe niile ọbụla o kwere na nkwa.
NDI ROM 4:17-21 Bible Nso (IGBOB)
(dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Nna nke ọtutu mba ka M'meworo gi,) n'iru Onye o kwere, bú Chineke, Onye nēme ndi nwuru anwu ka ha di ndu, Onye nākpọ kwa ihe nādighi, dika asi na ha di. Onye kwere mb͕e ọ gasiri oge olile-anya, ebe ọ dabere n'olile-anya, ka o we ghọ nna ọtutu mba, dika ihe ekwururi si di, Otú a ka nkpuru-gi gādi. O we tugharia uche n'aru nke onwe-ya nke nwuwori, (ebe ọ b͕ara ihe di ka ọgu arọ ise), tughari kwa uche n'àkpà-nwa Sera na ọ bu ihe nwuru anwu, ma emeghi ya ka ọ ghara idi ike n'okwukwe-ya: o jighi kwa ekweghi-ekwe nwe obi abua n'ebe nkwa Chineke di, kama ejiri okwukwe-ya me ka o nwe ike, ọ nēnye kwa Chineke otuto, nēkwezu kwa na ihe O kwereri na nkwa, Ọ puru ime kwa.