Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI ROM 3:9-24

NDI ROM 3:9-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Gịnị kwanụ? Anyị ọ ka ha mma? Mba, ma e meela ya rịị ka ọ pụta ìhè na mmadụ niile nọ nʼokpuru mmehie, ma ndị Juu ma ndị mba ọzọ. Dịka e dere ya, “Ọ dịghị onye ọbụla bụ onye ezi omume, ọ dịghị ọ bụladị otu onye. Ọ dịghị onye ọbụla na-aghọta, ọ dịkwaghị onye ọ na-agụ ịchọ Chineke. Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile, ọ dịghị onye bara uru nʼime ha. Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma, a pụghị ịchọta ọ bụladị otu onye. Akpịrị ha bụ ili ghere oghe, ha ji ire ha na-aghọ aghụghọ. Elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. Ọnụ ha jupụtara nʼokwu na-akụ ilu na ọbụbụ ọnụ. Ụkwụ ha na-eme ọsịịsọ ịkwafu ọbara. Mbibi na nhụju anya dị nʼụzọ ha niile. Ha amaghị ihe bụ ụzọ udo. Ha amatabeghị ihe ịtụ egwu Chineke pụtara.” Ugbu a, anyị maara na ihe ọbụla iwu kwuru, ọ bụ ndị nọ nʼokpuru iwu ka ọ dịịrị, ka esite otu a kpuchite ọnụ niile nʼotu nʼotu. Ma meekwa ka ụwa niile mata na ha bụ ndị ikpe mara nʼebe Chineke nọ. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke maka na ọ na-edebe iwu. Kama, ọ bụ site nʼiwu ka anyị ji mata ihe banyere mmehie. Ma ugbu a, emeela ka ezi omume Chineke pụta ìhè, site nʼiguzo iche nʼebe iwu dị, bụ nke iwu na ndị amụma gbakwara ama ya. Ezi omume a na-esite nʼebe Chineke nọ abịa, site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst nye ndị niile kweere. O nweghị ihe ịdị iche ọbụla dị na ya. Nʼihi na mmadụ niile emehiela ha ekwesikwaghị otuto Chineke. Ma ugbu a, agụọla ha na ndị ezi omume site nʼamara ya, site na mgbapụta nke si nʼaka Kraịst Jisọs.

NDI ROM 3:9-24 Bible Nso (IGBOB)

Gini kwa? àyi ka ha nma? É-è, ayi akaghi ha nma ma-ọli: n'ihi na ayi buru uzọ bo ndi-Ju bo kwa ndi-Grik ebubo, na ha nile nọ n'okpuru nmehie; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ dighi onye bu onye ezi omume, ọ dighi otù onye ma-ọli; Ọ dighi onye nāghọta, Ọ dighi onye nāchọ Chineke; Ha nile ewezugawo onwe-ha, ha nile abaghi n'ihe n'otù; Ọ dighi onye nēme ihe ọma, ọ dighi ọbuná otù onye: Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu; Ha jiri ire-ha ghọ aghughọ: Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha: Ndi ọnu-ha juru n'ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu: Ukwu-ha di ngwa iwusì ọbara; Nbibi na ihuju-anya di n'uzọ nile ha; Uzọ udo ka ha nāmaghi kwa: Egwù Chineke adighi n'anya-ha. Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n'okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n'otù n'otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n'ebe Chineke nọ: n'ihi na site n'ọlu nile nke iwu ọ dighi madu ọ bula agāgu n'onye ezi omume n'iru Ya: n'ihi na ọ bu n'aka iwu ka nmazu nke nmehie sitere. Ma ub͕u a emewo ka ezi omume Chineke puta ìhè nke nēguzo iche n'ebe iwu di, nke iwu ahu na ndi-amuma nāb͕ara ya àmà; ma ọ bu ezi omume Chineke, site n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist, nke diri ndi nile kwere: n'ihi na ọ dighi ihe di iche; n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke; anēwere kwa amara-Ya nāgu ha na ndi ezi omume n'onyinye efu site na nb͕aputa ahu nke di nime Kraist Jisus