NDI ROM 15:21-33
NDI ROM 15:21-33 Bible Nso (IGBOB)
kama, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, Ha gāhu, bú ndi akākọghi akukọ Ya mb͕e ọ bula, Ndi akānughi kwa gāghọta. N'ihi nka eb͕ochi-kwa-ram ọtutu oge ndia ibiakute unu: ma ub͕u a, ebe m'nēnweghi ebe ọ bula n'akuku ndia ọzọ, ebe ibiakute unu nāgusikwam ike ọtutu arọ ndia gara aga, mb͕e ọ bula m'gāga Spain (n'ihi na anamele anya na m'gēkiri unu mb͕e m'nāgabiga, anamele kwa anya na unu gēdupum n'ijem iga ebe ahu, ma ọ buru na afọ gēburu uzọ jum n'aru unu n'akuku ufọdu) ma ub͕u a, ka m'kwuru, agam Jerusalem, ebe m'nējere ndi nsọ ozi. N'ihi na ọ di Masedọnia na Akaia ezi nma inye ndi-ob͕eye n'etiti ndi nsọ nọ na Jerusalem ihe ufọdu ha gēnwekọ. N'ihi na ọ di ha ezi nma; ha bu kwa ndi ji ndi ahu ugwọ. N'ihi na asi na ndi mba ọzọ nwekọrọ ihe Mọ Nsọ nke ha, ha ji kwa ugwọ ifè ha òfùfè n'ihe nke anu-aru. Ya mere mb͕e m'mezusiri nka, ka-kwa-ra ha nkpuru a akàrà, m'gēsi na nke unu je Spain. Ma amataram na, mb͕e m'biakutere unu, ọ bu nime ozuzù ngọzi nke Kraist ka m'gābia. Ma, umu-nnam, ewerem Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, were kwa ihu-n'anya Mọ Nsọ, nāriọ unu, ka unu som nāb͕asi nb͕a ike n'ekpere unu nēkpere Chineke n'ihim; Ka ewe dọputam n'aka ndi nēkweyeghi ekwenye ndi nọ na Judia, ka ije-ozim nke m'ji je Jerusalem we búru kwa ihe ndi nsọ gānara nke-ọma; ka m'we biakute unu n'ọṅù site n'ọchichọ Chineke, ka mu na unu we zukọ kwa ike. Ma ka Chineke nke udo nọyere unu nile. Amen.
NDI ROM 15:21-33 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ma dịka e dere ya, “Ndị a na-agwaghị ihe banyere ya ga-ahụ, ndị a ka anụbeghị, ga-aghọtakwa.” Nʼezie, nke a bụ ihe mere m na-ejibeghị nwee ohere ịbịakwute unu. Nʼihi na ọ dịla ọtụtụ afọ kemgbe m bidoro na-enwe mmasị m ga-abịa hụ unu anya, ma ugbu a, ọrụ m nwere nʼakụkụ a agwụla, oge eruola mgbe m ji ahapụ ebe a. Nʼihi na nzube m bụ ijeru obodo Spen. Mgbe ọbụla m ga-agakwa, aga m akwụsị ịhụ unu na elekwa anya na unu ga-edupụ m nʼije m, mgbe mụ na unu jiri ọṅụ nọrọtụ nwa mgbe nta. Ma ugbu a, ana m aga Jerusalem ebe m na-ejere ndị nsọ ozi. Nʼihi na ọ dị ndị Masidonia na Akaịa ezi mma iwere nʼụfọdụ nʼihe ha nwere nyere ndị ogbenye nọ nʼetiti ndị nsọ nọ na Jerusalem aka. Ha ji ọṅụ mee nke a, nʼezie ha ji ha ụgwọ i mere ha otu a. Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ so ha keta oke na ngọzị nke Mmụọ Nsọ, ha ji ụgwọ isite nʼakụnụba ha nwere kenye ha. Ya mere, mgbe m mezuru nke a, hụkwa na ha anatala onyinye ahụ a tụkọtara ha, aga m abata ịhụ unu mgbe m na-aga Spen. Amaara m na mgbe m ga-abịakwute unu, aga m abịa nʼime ozuzu oke ngọzị nke Kraịst. Esi m nʼaka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya anyị nwere nʼime Mmụọ Nsọ na-arịọ unu, ụmụnna m, ka unu soro m na-ekpe ekpere, na-echetanụ m nʼekpere unu nʼihu Chineke. Ka a dọpụta m nʼaka ndị na-ekweghị ekwe nọ na Judịa. Ka ọrụ m maka Jerusalem bụrụ ihe ndị nsọ nọ ebe ahụ ga-anabata. Ka ọ ga-abụ site nʼuche Chineke, aga m abịakwute unu nʼọṅụ kurukwa ume ndụ na nnọkọ mụ na unu. Ka Chineke ahụ na-enye udo, nọnyere unu niile. Amen.