Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI ROM 15:1-33

NDI ROM 15:1-33 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Anyị onwe anyị bụ ndị dị ike kwesiri ịnagide mgbe ndị na-adịghị ike mejọrọ anyị, ọ bụghị ime ihe ga-atọ anyị ụtọ. Ka onye ọbụla nʼime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbataobi ya ụtọ maka ọdịmma ha, ka o wulie ha elu. Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya emeghị ihe tọrọ ya ụtọ, kama dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Mkparị niile nke ndị na-akparị gị dakwasịrị m!” Nʼihi na ihe niile edere nʼoge gara aga bụ iji kuziere anyị ihe, ka anyị nwee ike isite na ntachiobi nakwa nkasiobi, nke dị nʼakwụkwọ nsọ nwee olileanya. Ka Chineke ahụ na-enye agbamume na ntachiobi nye unu mmụọ nke ịdị nʼotu nʼetiti onwe unu, dịka Kraịst Jisọs nwere. Nʼihi na nke a ga-eme ka unu niile jikọtaa obi unu, na olu unu nʼotu, inye Chineke na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst otuto. Nʼihi ya, nabatanụ onwe unu dị ka Kraịst nabatara unu, iji wetara Chineke otuto. Ma ana m agwa unu na Kraịst aghọọla onye na-ejere ndị e biri ugwu ozi nʼihi eziokwu nke Chineke, iji mee ka nkwa e kwere ndị bụ nna nna anyị ochie guzozie. Ka ndị mba ọzọ nwe ike inye Chineke otuto maka ebere ya, dịka e dere ya, “Nʼihi nke a, aga m eto gị nʼetiti ndị mba ọzọ, aga m abụ abụ nye aha gị.” O kwukwara ọzọ sị, “Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ unu ndị mba ọzọ.” Ọzọkwa, “Toonu Onyenwe anyị unu ndị mba ọzọ niile, ka ndị niile dị iche iche jaakwa ya mma.” Ọzọkwa, Aịzaya na-asị, “Mgbọrọgwụ Jesi ga-epulite ọzọ, onye nke ga-ebili ịchị mba niile, ndị mba ọzọ ga-enwekwa olileanya nʼime ya.” Ka Chineke onye bụ isi olileanya mejupụta unu nʼoke ọṅụ na udo dịka unu na-atụkwasị ya obi, ka unu si otu a bụrụ ndị olileanya ha jubigara oke site nʼike nke Mmụọ Nsọ. Ụmụnna m, o doro m anya na unu onwe unu jupụtara nʼịdị mma, bụrụkwa ndị tozuru etozu nʼihe ọmụma ruo na unu nwere ike izirịta onwe unu ihe. Ma otu ọ dị, edepụtala m ụfọdụ isi okwu nʼebe o doro anya nye unu, iji chetara unu ha ọzọ, nʼihi amara Chineke nyere m, abụ m onyeozi Kraịst Jisọs, ana m arụkwa ọrụ onye nchụaja nʼizisa oziọma Chineke, ka ofufe ndị mba ọzọ bụrụ aja Chineke ga-anara nke ọma, nke Mmụọ Nsọ dokwara nsọ. Nʼihi ya, ana m anya isi nʼime Kraịst Jisọs banyere ọrụ m na-arụrụ Chineke. Agaghị m anwa anwa kwuo okwu banyere ihe ọzọ karịakwa ihe ndị ahụ Kraịst rụpụtara site nʼaka m, bụ idubata ndị mba ọzọ, ime ka ha rube isi nye Chineke, site nʼokwu ọnụ m na ihe m rụrụ, nke pụtara ihe nʼọrụ ebube na ihe ịrịbama site nʼike nke Mmụọ nke Chineke. Ya mere, site na Jerusalem ruo Ilirikom, ekwusaala m nʼụzọ zuru ezu, oziọma Kraịst. Ọchịchọ obi m mgbe niile bụ ikwusa oziọma ahụ nʼebe ọbụla ndị mmadụ na-anụtụbeghị ihe banyere Kraịst, ka m ghara ịbụ onye na-ewukwasị ihe nʼelu ntọala nke onye ọzọ tọrọ, ma dịka e dere ya, “Ndị a na-agwaghị ihe banyere ya ga-ahụ, ndị a ka anụbeghị, ga-aghọtakwa.” Nʼezie, nke a bụ ihe mere m na-ejibeghị nwee ohere ịbịakwute unu. Nʼihi na ọ dịla ọtụtụ afọ kemgbe m bidoro na-enwe mmasị m ga-abịa hụ unu anya, ma ugbu a, ọrụ m nwere nʼakụkụ a agwụla, oge eruola mgbe m ji ahapụ ebe a. Nʼihi na nzube m bụ ijeru obodo Spen. Mgbe ọbụla m ga-agakwa, aga m akwụsị ịhụ unu na elekwa anya na unu ga-edupụ m nʼije m, mgbe mụ na unu jiri ọṅụ nọrọtụ nwa mgbe nta. Ma ugbu a, ana m aga Jerusalem ebe m na-ejere ndị nsọ ozi. Nʼihi na ọ dị ndị Masidonia na Akaịa ezi mma iwere nʼụfọdụ nʼihe ha nwere nyere ndị ogbenye nọ nʼetiti ndị nsọ nọ na Jerusalem aka. Ha ji ọṅụ mee nke a, nʼezie ha ji ha ụgwọ i mere ha otu a. Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ so ha keta oke na ngọzị nke Mmụọ Nsọ, ha ji ụgwọ isite nʼakụnụba ha nwere kenye ha. Ya mere, mgbe m mezuru nke a, hụkwa na ha anatala onyinye ahụ a tụkọtara ha, aga m abata ịhụ unu mgbe m na-aga Spen. Amaara m na mgbe m ga-abịakwute unu, aga m abịa nʼime ozuzu oke ngọzị nke Kraịst. Esi m nʼaka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya anyị nwere nʼime Mmụọ Nsọ na-arịọ unu, ụmụnna m, ka unu soro m na-ekpe ekpere, na-echetanụ m nʼekpere unu nʼihu Chineke. Ka a dọpụta m nʼaka ndị na-ekweghị ekwe nọ na Judịa. Ka ọrụ m maka Jerusalem bụrụ ihe ndị nsọ nọ ebe ahụ ga-anabata. Ka ọ ga-abụ site nʼuche Chineke, aga m abịakwute unu nʼọṅụ kurukwa ume ndụ na nnọkọ mụ na unu. Ka Chineke ahụ na-enye udo, nọnyere unu niile. Amen.

NDI ROM 15:1-33 Bible Nso (IGBOB)

Ma ayi onwe-ayi, bú ndi nwere ike, ayi aghaghi ibū adighi-ike nile nke ndi nēnweghi ike, na ighara ime ihe nātọ onwe-ayi utọ. Onye ọ bula n'etiti ayi, ya me ihe gātọ onye-ab͕ata-obi-ya utọ iwetara ya ezi ihe, ka ọ we wulie ya elu dika ulo. N'ihi na Kraist-ayi emeghi kwa ihe tọrọ Onwe-ya utọ; kama, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta dakwasirim. N'ihi na ka ha ra, bú ihe edere n'akwukwọ nsọ n'oge gara aga, edere ha izí ayi ihe, ka ayi we were ntachi-obi na nkasi-obi nke ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ nwe olile-anya. Ma ka Chineke nke ntachi-obi na nke nkasi-obi nye unu ka unu tukwasi uche n'otù ihe ahu n'etiti-onwe-unu dika Kraist Jisus si chọ: ka unu we ji otù obi ji kwa otù olu nēnye Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist otuto. N'ihi ya nākpọbatanu ibe-unu, dika Kraist-ayi kpọbata-kwa-ra unu, ka ewe nye Chineke otuto. N'ihi na asim na emewo Kraist ka Ọ buru onye nējere obibì-úgwù ozi n'ihi ezi-okwu Chineke, ka O we me ka nkwa nile ekwere nna-ayi-hà guzosie ike, ka ndi mba ọzọ we nye kwa Chineke otuto n'ihi ebere-Ya; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, N'ihi nka ka M'gēkwuputa Gi n'etiti mba nile, Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma. Ọzọ kwa Ọ si, Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya nwe obi-utọ. Ọzọ kwa, Tonu Onye-nwe-ayi, unu mba nile; Ka ndi nile di iche iche nāja kwa Ya. Ọzọ kwa, Aisaia si, Nkpọrọgwu ahu nke Jesi gādi, Na onye ahu Nke nēbili ibu onye-isi mba nile; Onye ahu ka ndi mba ọzọ gēle anya Ya. Ma Chineke nke olile-anya ahu mejue unu n'ọṅù nile na udo nile n'ikwe-ekwe, ka unu we nwebiga olile-anya ahu ókè, n'ike Mọ Nsọ. Ma emewom ka m'kweye, umu-nnam, ọbuná mu onwem, ihe bayere unu, na unu onwe-unu juputara n'idi-nma, na emejuwo kwa unu n'ihe-ọmuma nile, na unu pu-kwa-ra idurita onwe-unu ọdú. Ma ejikaririm anya-ike degara unu akwukwọ n'otù akuku, dika ọ bu ichetara unu ọzọ, n'ihi amara nke Chineke nyerem, ka m'we buru onye nēfè Kraist Jisus òfùfè ijekuru ndi mba ọzọ, nālu kwa ọlu onye-nchu-àjà nke ozi ọma Chineke, ka ewe me ka iche-ndi-mba-ọzọ-n'iru-Chineke buru ihe agānara nke-ọma, ebe edoro ya nsọ nime Mọ Nsọ. Ya mere enwerem inya-isim nime Kraist Jisus n'ihe nile diri Chineke. N'ihi na m'gaghi-enwe anya-ike ikwu ihe o bula ma-ọbughi n'ihe nile Kraist lutara site n'akam, ime ka ndi mba ọzọ ṅa nti, n'okwu na ọlu, n'ike nke ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, n'ike nke Mọ Nsọ; ya mere site na Jerusalem, na ala nke di ya gburugburu rue Ilirikọm, ezìzuwom ozi ọma Kraist; ma nka ka m'mere nējisi ike izisa ozi ọma ahu otú a, ọ bughi ebe akpọrọri aha Kraist, ka m'ghara iwu ulo n'elu ntọ-ala onye ọzọ; kama, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, Ha gāhu, bú ndi akākọghi akukọ Ya mb͕e ọ bula, Ndi akānughi kwa gāghọta. N'ihi nka eb͕ochi-kwa-ram ọtutu oge ndia ibiakute unu: ma ub͕u a, ebe m'nēnweghi ebe ọ bula n'akuku ndia ọzọ, ebe ibiakute unu nāgusikwam ike ọtutu arọ ndia gara aga, mb͕e ọ bula m'gāga Spain (n'ihi na anamele anya na m'gēkiri unu mb͕e m'nāgabiga, anamele kwa anya na unu gēdupum n'ijem iga ebe ahu, ma ọ buru na afọ gēburu uzọ jum n'aru unu n'akuku ufọdu) ma ub͕u a, ka m'kwuru, agam Jerusalem, ebe m'nējere ndi nsọ ozi. N'ihi na ọ di Masedọnia na Akaia ezi nma inye ndi-ob͕eye n'etiti ndi nsọ nọ na Jerusalem ihe ufọdu ha gēnwekọ. N'ihi na ọ di ha ezi nma; ha bu kwa ndi ji ndi ahu ugwọ. N'ihi na asi na ndi mba ọzọ nwekọrọ ihe Mọ Nsọ nke ha, ha ji kwa ugwọ ifè ha òfùfè n'ihe nke anu-aru. Ya mere mb͕e m'mezusiri nka, ka-kwa-ra ha nkpuru a akàrà, m'gēsi na nke unu je Spain. Ma amataram na, mb͕e m'biakutere unu, ọ bu nime ozuzù ngọzi nke Kraist ka m'gābia. Ma, umu-nnam, ewerem Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, were kwa ihu-n'anya Mọ Nsọ, nāriọ unu, ka unu som nāb͕asi nb͕a ike n'ekpere unu nēkpere Chineke n'ihim; Ka ewe dọputam n'aka ndi nēkweyeghi ekwenye ndi nọ na Judia, ka ije-ozim nke m'ji je Jerusalem we búru kwa ihe ndi nsọ gānara nke-ọma; ka m'we biakute unu n'ọṅù site n'ọchichọ Chineke, ka mu na unu we zukọ kwa ike. Ma ka Chineke nke udo nọyere unu nile. Amen.