Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI ROM 12:9-21

NDI ROM 12:9-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ka ịhụnanya bụrụ nke ihu abụọ nʼadịghị na ya, kpọọ ihe ọjọọ asị, jidesie ihe dị mma ike. Hụrịtanụ onwe unu nʼanya, dịka ụmụ nke otu nna. Ka ihe ibe unu na-eme na-atọ unu ụtọ. Na-asọpụkwaranụ ibe unu karịa otu ha si asọpụrụ unu. Unu abụla ndị umengwụ nʼọrụ unu. Kama werenụ mmụọ na obi na-anụ ọkụ na-ejere Onyenwe anyị ozi mgbe niile. Nweenụ obi aṅụrị nʼime olileanya, nweenụ ntachiobi nʼime nsogbu, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile. Na enyetụnụ ụfọdụ ndị nsọ ihe site nʼihe unu nwere iji gboo mkpa dịrị ha. Na-elekọtakwanụ ndị ọbịa anya nke ọma. Gọzienụ ndị na-akpagbu unu, gọzienụ ha, unu abụkwala ha ọnụ. Mgbe ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ, soronụ ha ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ha nọ nʼiru ụjụ, soronụ ha ruo ụjụ. Na-ebinụ nʼudo. A bụla onye mpako, unu na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe niile. Ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere gị. Kama, na-echenụ otu unu ga-esi mee ihe dị mma nʼanya mmadụ niile. Dịka ike gị niile ha, mee ka gị na onye ọbụla biri nʼudo. Ndị enyi m, unu abọla ọbọ, kama hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọtara unu ọbọ. Nʼihi na e dere ya, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ka Onyenwe anyị kwuru. Ma otu ọ dị, “ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, were nri zụọ ya, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ihe ọṅụṅụ ka ọ ṅụọ, mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya.” Unu ekwela ka ihe ọjọọ merie unu, kama werenụ ezi ihe merie ihe ọjọọ.

NDI ROM 12:9-21 Bible Nso (IGBOB)

Ka ihu-n'anya buru ihe nke iru-abua nādighi nime ya. Nākpọnu ajọ ihe asì; nārapara ezi ihe n'aru. N'akuku ihu-n'anya-unu n'ebe umu-nna-unu nọ, ka ihe madu-ibe-unu nātọrita unu utọ nke-uku; n'akuku nsọpuru-unu, nācharanu ibe-unu uzọ; n'akuku inu-ọku nke obì-unu, nāgharanu idi ọ̀bọ̀; n'akuku mọ-unu, nādinu ọku; n'akuku Onye-nwe-ayi, nābunu orù; n'akuku olile-anya-unu, nāṅurinu ọṅu; n'akuku nkpab͕u-unu, nēnwenu ntachi-obi; n'akuku ekpere-unu, nānọgidesinu ike; n'akuku ihe nākpà ndi nsọ, nēnwekọnu ihe; nāb͕asonu ọlu ile ndi-ọbìa anya nke-ọma. Nāgọzinu ndi nēsob͕u unu; nāgọzinu, abu-kwa-la ha ọnu. Nēsonu ndi nāṅuri n'iṅuri ọṅu; nēsonu ndi nākwa ákwá n'ikwa ákwá. Nātukwasinu uche n'otù ihe ahu n'ebe ibe-unu nọ. Unu atukwasila uche n'ihe di elu, kama ka ndi ọnọdu-ha di ala nādọrọ unu iso ha. Unu enwela uche n'anya onwe-unu. Unu enyeghachila onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ. Burunu uzọ nēchè ihe ọma n'iru madu nile. Asi na ọ bu ihe gēkwe unu, ka ihe nke diri unu onwe-unu ra, unu na madu nile nādi n'udo. Ndi m'huru n'anya, unu abọlara onwe-unu ọ́bọ̀, kama charanu iwe ahu uzọ: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Mu nwe ọ́bọ̀; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru. Ma ọ buru na agu nāgu onye-iro-gi, nāzù ya; ọ buru na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri: n'ihi na n'ime nka i gāgukwasi icheku nēre ọku n'isi-ya. Ekwela ihe ọjọ meri gi, kama were ezi ihe meri ihe ọjọ.