NDI ROM 12:6-8
NDI ROM 12:6-8 Bible Nso (IGBOB)
Ma ebe ayi nwere onyinye-amara di iche iche dika amara nke enyere ayi si di, ma ayi nwere ibu-amuma, ka ayi nēbu amuma ka okwukwe-ayi ra; ma-ọbu ije-ozi, ka ayi nānọ n'ije-ozi-ayi; ma-ọbu onye nēzi ihe, ya nọ n'ozizi-ya; ma-ọbu onye nākasi obi, ya nọ na nkasi-obi-ya: onye nēme ka ndi ọzọ keta ihe o nwere, ya were afọ-ofufo me ya; onye bu onye-isi, ya were obi nānu ọku nābu isi; onye nēme ebere, ya were obi-utọ me ya.
NDI ROM 12:6-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Anyị nwere onyinye dị iche iche nke e sitere nʼamara nye anyị, ọ bụrụ na onye ọbụla nwere onyinye ibu amụma, ya buo ya dịka okwukwe o nwere ha. Ọ bụrụ ije ozi, ya jee ozi, ya bụrụkwanụ izi ihe, ya zie ihe. Ka onye nwere onyinye ịgbaume, gbaa ndị ọzọ ume, ya bụrụkwanụ inyeaka, ka onye nwere onyinye a site nʼafọ ofufu mee ya, ọ bụrụ ịbụ onyendu, ka onye ahụ duo site nʼikpachapụ anya, ya bụrụkwanụ ime ebere, ka onye ahụ jiri obi ụtọ na-eme ya.