NDI ROM 11:29-32
NDI ROM 11:29-32 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na enye anarakwa adịghị nʼonyinye nakwa ọkpụkpọ Chineke. Unu onwe unu ndị na-enupuru Chineke isi na mbụ, anatala ebere ya ugbu a, nʼihi nnupu isi ha. Otu a ka ọ dịkwa, ha bụ ndị na-enupu isi ugbu a ka ha nwe ike soro unu keta oke site nʼebere Chineke meere unu. Nʼihi na Chineke enyefeela onye ọbụla nʼaka nnupu isi, ka o si otu a gosi mmadụ niile obi ebere ya.
Kesaa
Gụọ NDI ROM 11NDI ROM 11:29-32 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na nchèghari adighi n'onyinye-amara nile na ọkpukpọ nke Chineke. N'ihi na dika unu onwe-unu nēkweyeghi Chineke n'oge gara aga, ma ub͕u a emere unu ebere n'ekweyeghi-ekweye nke ha, otú a ka ndia nēkweyeghi kwa ub͕u a, ka ewe were ebere emere unu mere ha onwe-ha ebere ub͕u a. N'ihi na Chineke mechibidoro ha nile nime ekweyeghi-ekweye, ka O we mere ha nile ebere.
Kesaa
Gụọ NDI ROM 11