NDI ROM 11:22-36
NDI ROM 11:22-36 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere le obi-ọma na aka-ike nke Chineke: n'aru ndi ndi a ka aka-ike-Ya dakwasiri; ma n'aru gi ka obi-ọma Chineke nādikwasi, ma ọ buru na i gānọgide n'obi-ọma-Ya: ebe agēbipu kwa gi onwe-gi ma ọ buru na i nọgideghi otú a. Ndi ahu kwa, ma ọ buru na ha anọgideghi n'ekweghi-ekwe-ha, agānyakudo ha: n'ihi na Chineke puru inyakudo ha ọzọ. N'ihi na asi na ebipuru gi onwe-gi n'osisi olive nke bu nke ọhia ka o si puta uwa, ewe nyakudo gi n'osisi olive ọma n'uzọ nke nēmegide ka o si puta uwa: àgēsi aṅa ghara inyakudo kari ndi ahu nke-uku, bú alaka osisi olive ji puta uwa, n'osisi olive nke aka ha? N'ihi na achọghm ka unu ghara ima ihe-omimi a, umu-nnam, ka unu ghara inwe uche n'anya onwe-unu, na emewo Israel obi-etili ufọdu, rue mb͕e ozùzù ndi mba ọzọ gābata; otú a agāzọputa kwa Israel nile: dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-ndọputa ahu gēsi na Zaion puta; Ọ gēchighari asọpurughi-Chineke nile ka ọ pua na Jekob: Nka bu kwa ọb͕ub͕a-ndu gādiri ha site n'ebe M'nọ, Mb͕e ọ bula M'gēwepu nmehie nile ha. N'akuku ozi ọma, ha bu ndi-iro n'ihi unu: ma n'akuku nrọputa, ha bu ndi ahuru n'anya n'ihi nna-ayi-hà. N'ihi na nchèghari adighi n'onyinye-amara nile na ọkpukpọ nke Chineke. N'ihi na dika unu onwe-unu nēkweyeghi Chineke n'oge gara aga, ma ub͕u a emere unu ebere n'ekweyeghi-ekweye nke ha, otú a ka ndia nēkweyeghi kwa ub͕u a, ka ewe were ebere emere unu mere ha onwe-ha ebere ub͕u a. N'ihi na Chineke mechibidoro ha nile nime ekweyeghi-ekweye, ka O we mere ha nile ebere. A! omimi nke àkù nke amam-ihe na nke ihe-ọmuma kwa nke Chineke! le otú anēnweghi ike ichọputa ikpé-Ya nile, otú anēnweghi kwa ike ituputa uzọ-Ya nile! N'ihi na ònye mara uche Onye-nwe-ayi? ma-ọbu ònye putara ibu onye Ya na ya nāb͕a izù? ma-ọbu ònye buru uzọ nye Ya, agēnyeghachi kwa ya ọzọ? N'ihi na ihe nile sitere nime Ya, site kwa n'aka-Ya, di-kwa-ra Ya. Ọ bu Ya ka otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
NDI ROM 11:22-36 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, tulee obiọma na aka ike Chineke, aka ike nʼebe ndị dara ada nọ, ma obiọma nʼebe unu nọ, naanị mgbe unu na-anọgideghị nʼobi ebere ya, ma ọ bụghị ya, ọ ga-anyakapụkwa unu. Ma ọ bụrụ na ha anọgideghị na-ekweghị ekwe, a ga-anyapagidekwa ha nʼihi na Chineke pụrụ ịnyapagide ha ọzọ. Nʼihi na asị na e gbupụtara unu site nʼalaka osisi oliv ọhịa, nyapagide unu nʼosisi oliv ọma ahụ nʼụzọ na-abụghị usoro ndụ, gịnị kwanụ ga-egbochi ịnabata alaka ndị ya, bụ ndị si na ya, mee ka ha laghachi azụ nʼosisi oliv ahụ e si nyakapụ ha. Ụmụnna m, achọrọ m ka unu mata ihe omimi a, ka unu ghara ịnya isi. Nnupu isi ụfọdụ ụmụ Izrel agaghị adịgide kama ọ ga-adị ruo nʼoge ọnụọgụgụ ndị mba ọzọ a ga-anabata zuru. Mgbe ahụ, a ga-azọpụta Izrel niile. Dịka e dere ya, “Onye nzọpụta ga-esite na Zayọn bịa. Ọ ga-eme ka Jekọb site na ndụ asọpụrụghị Chineke chigharịa. Nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha, mgbe m wepụrụ mmehie ha niile.” Nʼihe banyere oziọma, ha bụ ndị iro nke Chineke nʼihi unu. Ma a bịa nʼihe gbasara nhọpụta, ha bụ ndị nke a hụrụ nʼanya nʼihi ndị nna nna ha. Nʼihi na enye anarakwa adịghị nʼonyinye nakwa ọkpụkpọ Chineke. Unu onwe unu ndị na-enupuru Chineke isi na mbụ, anatala ebere ya ugbu a, nʼihi nnupu isi ha. Otu a ka ọ dịkwa, ha bụ ndị na-enupu isi ugbu a ka ha nwe ike soro unu keta oke site nʼebere Chineke meere unu. Nʼihi na Chineke enyefeela onye ọbụla nʼaka nnupu isi, ka o si otu a gosi mmadụ niile obi ebere ya. Leenụ ka o si dị omimi bụ akụ ahụ Chineke nwere! Lee ka ịba ụba nke amamihe ya na ihe ọmụma ya siri dị ukwuu! Apụghị ịchọpụta ikpe ya niile, ụzọ ya niile bụkwa ihe apụghị ịchọpụta. “Onye maara uche Onyenwe anyị? Ma ọ bụ onye bụ onye ahụ na-enye ya ndụmọdụ?” “Onye burula ụzọ nye Chineke ihe, nke ga-eme ka Chineke kwụghachi ya?” Nʼihi na ihe niile sitere nʼime ya, sitekwa nʼaka ya, dịkwara ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi! Amen.