NDI ROM 1:26-28
NDI ROM 1:26-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ nke a mere Chineke jiri nyefee ha nʼaka agụụ anụ ahụ nke na-eme ihere. Nʼihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nʼụzọ na-ezighị ezi. Ọzọkwa, kama ha na ndị inyom inwe mmekọrịta; ndị ikom ha họọrọ ka ha na ndị ikom ibe ha na-enwe ụdị mmekọrịta nke ha na ndị inyom kwesiri inwe. Nwoke na-edinakwuru nwoke ibe ya. Nʼụzọ dị otu a, ha natakwara ntaramahụhụ kwesiri ha nʼihi ihe ọjọọ ndị a ha na-eme. Ya mere, ebe ha kpachapụrụ anya jụ ịmata onye Chineke bụ, Chineke nyere ha akọnuche ndị nzuzu, nke mere ka ha na-eme ihe ọjọọ niile nke ajọ echiche obi ha chepụtara.
NDI ROM 1:26-28 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi nka Chineke rara ha nye n'aka agu ihe-ihere: n'ihi na ndinyom-ha were nwanyi ha bu site n'ọmumu b͕anwere ihe nēmegide ka esi mu ha: otú a ndikom rapu-kwa-ra otú anēme nwanyi site ka esi mu ya, we re ọku n'agu-ha n'aru ndikom-ibe-ha, ndikom nāluputa ihe nādighi nma n'anya n'aru ndikom, nānara kwa nime onwe-ha ugwọ-ọlu ahu nke njehie-ha nke ha nāghaghi inara. Dika ha juru inọgide n'imazu Chineke, Chineke ra-kwa-ra ha nye n'aka uche ajuru aju, ime ihe ahu nile nēkwesighi