NDI ROM 1:21-32
NDI ROM 1:21-32 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ eziokwu na ha maara Chineke, ma ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye ya ekele dịka Chineke. Echiche uche ha bụ ihe efu, nzuzu ha mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị. Mgbe ha na-eche na ha bụ ndị maara ihe, ha amataghị na ha bụ ndị nzuzu. Kama ife Chineke na-adịghị anwụ anwụ ofufe, ha weere otuto ha kwesiri inye ya nye ihe ndị ahụ ha jiri aka ha kpụọ. Ihe ndị a yiri mmadụ na-anwụ anwụ, na nnụnụ, na ụmụ anụmanụ, na ihe na-akpụ akpụ nʼala. Nʼihi ya, Chineke hapụrụ ha ka ha mee ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ nye adịghị ọcha nke ịkwa iko, ha jikwa ahụ ha emerịta mpu nʼetiti onwe ha. Ha were okwu ụgha dochie nʼọnọdụ eziokwu banyere Chineke. Ha na-asọpụrụ, na-efekwa ihe e kere eke, ma hapụ Onye okike, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen. Ọ bụ nke a mere Chineke jiri nyefee ha nʼaka agụụ anụ ahụ nke na-eme ihere. Nʼihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nʼụzọ na-ezighị ezi. Ọzọkwa, kama ha na ndị inyom inwe mmekọrịta; ndị ikom ha họọrọ ka ha na ndị ikom ibe ha na-enwe ụdị mmekọrịta nke ha na ndị inyom kwesiri inwe. Nwoke na-edinakwuru nwoke ibe ya. Nʼụzọ dị otu a, ha natakwara ntaramahụhụ kwesiri ha nʼihi ihe ọjọọ ndị a ha na-eme. Ya mere, ebe ha kpachapụrụ anya jụ ịmata onye Chineke bụ, Chineke nyere ha akọnuche ndị nzuzu, nke mere ka ha na-eme ihe ọjọọ niile nke ajọ echiche obi ha chepụtara. Ha jupụtara nʼajọ omume na mmehie niile, anya ukwu na aghụghọ. Ha jupụtakwara nʼekworo, na igbu mmadụ, na esemokwu, na uche gbagọrọ agbagọ na ịkpọ asị. Ha bụ ndị na-ekwu okwu azụ, na ndị nkwutọ na ndị kpọrọ Chineke asị, na ndị na-akparị mmadụ na ndị mpako na ndị na-anya isi. Ha na-atụpụta ụzọ ọhụrụ ime ihe ọjọọ, ha adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha. Ha bụkwa ndị na-enweghị nghọta, ndị na-enweghị okwukwe, ndị obi ọjọọ na ndị na-enweghị obi ebere. Ha maa na Chineke nyere iwu dị ike na ndị na-ebi ndụ dị otu a kwesiri ọnwụ, ma ha gara nʼihu na-eme ihe ndị a, ma na-akwalịkwa mmụọ ndị ọzọ ka ha soro na-eme ha.
NDI ROM 1:21-32 Bible Nso (IGBOB)
n'ihi na, ọ bu ezie na ha mara Chineke, ma ha enyeghi Ya otuto dika Chineke, ha ekeleghi kwa Ya; kama emere ha ihe-efu n'ihe nile ha nātule n'obi-ha, obi-ha nke nēnweghi nghọta b͕a-kwa-ra ọchichiri. Mb͕e ha nēkwu na ha bu ndi mara ihe, ha we ghọ ndi-nzuzu, we were ebube nke Chineke anāpughi imebi b͕anwere oyiyi nke onyinyo madu apuru imebi, na nke anu-ufe na anu ukwu anọ na ihe nākpu akpu di iche iche. N'ihi ya Chineke rara ha nye n'aka adighi-ọcha n'ihe ọjọ nile nāgu obi-ha, ka ewe me aru-ha ihe-ihere n'etiti ha: ebe ha were ezi-okwu nke Chineke b͕anwere ugha-ha, ha we sọpuru nēkpe-kwa-ra ihe ekère èkè kama Onye kère èkè, Onye agọziworo ebighi-ebi. Amen. N'ihi nka Chineke rara ha nye n'aka agu ihe-ihere: n'ihi na ndinyom-ha were nwanyi ha bu site n'ọmumu b͕anwere ihe nēmegide ka esi mu ha: otú a ndikom rapu-kwa-ra otú anēme nwanyi site ka esi mu ya, we re ọku n'agu-ha n'aru ndikom-ibe-ha, ndikom nāluputa ihe nādighi nma n'anya n'aru ndikom, nānara kwa nime onwe-ha ugwọ-ọlu ahu nke njehie-ha nke ha nāghaghi inara. Dika ha juru inọgide n'imazu Chineke, Chineke ra-kwa-ra ha nye n'aka uche ajuru aju, ime ihe ahu nile nēkwesighi; ebe ha juputara n'ajọ omume nile, ajọ ọlu, anya-uku, obi ọjọ; juputa kwa n'ekworo, ob͕ub͕u-madu, esem-okwu, aghughọ, uche ọjọ; ndi-ntakwu, ndi nēkwutọ madu, ndi nākpọ Chineke asì, ndi nēme madu ihe-ihere, ndi-npako, ndi nānya isi, ndi nāchọputa ihe ọjọ, ndi nēkweyeghi ndi muru ha, Ndi nēnweghi nghọta, ndi nēmebi ọb͕ub͕a-ndu, ndi ihe madu-ibe-ha nādighi-atọ utọ, ndi nēnweghi obi-ebere: madu ndi, ọ bu ezie na ha mazuru ihe Chineke guru n'ihe ziri ezi, na ndi nēme ihe di otú a kwesiri ọnwu, ma ọ bughi nání na ha nēme ha, kama ndi nēme ha di kwa ha ezi nma.