NDI ROM 1:20-21
NDI ROM 1:20-21 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na ihe-Ya anya nāhughi site n'òkìkè uwa ka anāhu nke-ọma, ebe anāghọta ha site n'ihe nile ekère èkè, bú ike ebighi-ebi Ya na udi-Chineke-Ya; ka ha ghara inwe ngọpu: n'ihi na, ọ bu ezie na ha mara Chineke, ma ha enyeghi Ya otuto dika Chineke, ha ekeleghi kwa Ya; kama emere ha ihe-efu n'ihe nile ha nātule n'obi-ha, obi-ha nke nēnweghi nghọta b͕a-kwa-ra ọchichiri.
NDI ROM 1:20-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na site nʼoge Chineke kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya, ụdịdị ya nke a na-apụghị ịhụ anya na ike nke ebighị ebi ya na ụdịdị ịdị nsọ ya ka e mere ka ọ pụta ìhè nye ụmụ mmadụ. Ụmụ mmadụ na-aghọta ihe ndị a site nʼihe ndị e kere eke. Nʼihi nke a ụmụ mmadụ enwekwaghị ngọpụ. Ọ bụ eziokwu na ha maara Chineke, ma ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye ya ekele dịka Chineke. Echiche uche ha bụ ihe efu, nzuzu ha mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị.