NKPUGHE 8:1-5
NKPUGHE 8:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-asa, ewe dere ji n'elu-igwe oge ra ka nkera nke otù hour. M'we hu ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nēguzo n'iru Chineke; ewe nye ha opì asa. Mọ-ozi ọzọ we bia guzo n'elu ebe-ichu-àjà ahu, nēnwe ihe nke ọla-edo eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; ewe nye ya ọtutu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ we tukwasi ha n'ekpere ndi nsọ nile nke di n'elu ebe-ichu-àjà ahu nke ọla-edo nke di n'iru oche-eze ahu. Anwuru-ọku nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ahu soro ekpere ndi nsọ site n'aka mọ-ozi ahu rigo n'iru Chineke. Mọ-ozi ahu we were ihe ahu eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpojue ya n-ọku nke sitere n'ọku nke ebe-ichu-àjà ahu, we tubà ya n'uwa: éb͕è-elu-igwe, na olu na àmùmà, na ala-ọma-jijiji we so.
NKPUGHE 8:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe o meghere akara nke asaa, akụkụ niile nke eluigwe dara jụụ ruo ihe dị ka iri nkeji atọ. Ahụrụ m ndị mmụọ ozi asaa, ndị na-eguzo nʼihu Chineke. E nyere ha opi ike nʼotu nʼotu. Mmụọ ozi ọzọ nke ji ite igwe ntakịrị e ji ọlaedo kpụọ bịara guzo nʼihu ebe ịchụ aja. E nyere ya ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ ka o jiri chụọ aja, ya na ekpere ndị nsọ niile, nʼebe ịchụ aja e jiri ọlaedo wuo, nʼihu ocheeze ahụ. Anwụrụ ọkụ nke ihe ahụ na-esi isi ụtọ, ya na ekpere ndị nsọ sitere nʼaka mmụọ ozi ahụ rigoo elu nʼihu Chineke. Mgbe ahụ kwa, mmụọ ozi ahụ weere ọkụ sitere nʼebe ịchụ aja ahụ tinye ya nʼime ite igwe ntakịrị ahụ, tụda ya, ka ọ danye nʼime ụwa. Mgbe o mere nke a, ụzụ egbe eluigwe dara, amụma gbukwara nʼụzọ dị oke egwu. Ala ọma jijiji dakwasịkwara ebe niile nʼụwa.