NKPUGHE 5:9-14
NKPUGHE 5:9-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ha na-abụ abụ ọhụrụ na-asị, “I kwesiri ịnara akwụkwọ ahụ na ịnyakapụ akara ya, nʼihi na e gburu gị, ma site nʼọbara gị, ị gbataara Chineke ndị mmadụ, ndị si nʼebo niile, na asụsụ niile, na ndị niile, na mba niile. Ị chịkọtaala ha, mee ha otu alaeze na ndị nchụaja na-ejere Chineke anyị ozi. Ha ga-achịkwa achị nʼụwa.” Mgbe ahụ, elere m anya, hụ ma nụkwa olu nke ọtụtụ ndị mmụọ ozi, nke ọnụọgụgụ ha ruru puku kwụrụ puku, na nde kwụrụ nde. Ha gbara ocheeze ahụ gburugburu, na anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ. Ha na-abụ abụ nʼoke olu na-asị, “O kwesiri bụ Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu ịnara ike na akụnụba na amamihe na ike na nsọpụrụ na otuto na ngọzị.” Mgbe ahụ, anụrụ m ka ihe niile nọ nʼeluigwe na ndị nọ nʼụwa na ndị nọ nʼokpuru ụwa, na ndị nọ nʼokpuru oke osimiri na-eti mkpu abụ na-asị, “Ka ngọzị, na nsọpụrụ niile, na otuto niile, na ike niile dịrị onye ahụ na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, na Nwa Atụrụ ahụ ruo mgbe niile ebighị ebi!” Anụ anọ ahụ dị ndụ zakwara sị, “Amen!” Ndị okenye ahụ dakwara nʼala nʼihu ya kpọọ isiala nye ya.
NKPUGHE 5:9-14 Bible Nso (IGBOB)
Ha nābù kwa abù ọhu, si, I kwesiri inata akwukwọ ahu, na isaghe akàrà-ya: n'ihi na eb͕uru Gi eb͕u, I were kwa ọbara-Gi b͕atara Chineke madu si n'ebo nile ọ bula, na asusu nile ọ bula, na ndi nile ọ bula, na mba nile ọ bula, puta, I we me ha ka ha buru ala-eze na ndi-nchu-àjà nye Chineke-ayi; ha bu kwa eze n'elu uwa. M'we hu, nu kwa olu ọtutu ndi-mọ-ozi ndi nọ oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu na ndi-okenye ahu gburugburu; ọnu-ọgugu-ha riri oké nne nke-uku, nke anāpughi iguta ha; anurum ka ha were oké olu nāsi, O kwesiri, bú Nwa-aturu ahu Nke eb͕uworo eb͕u, inata ike nile, na àkù, na amam-ihe, na ume, na nsọpuru, na otuto, na ngọzi. M'we nu ihe nile ọ bula ekère èkè nke di n'elu-igwe, na n'elu uwa, na n'okpuru uwa, na n'elu oké osimiri, ha na ihe nile di ha nime, ka ha nāsi, Ọ bu Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu, Ya na Nwa-aturu ahu, ka ngọzi nile na nsọpuru nile na otuto nile na ike nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Ihe anọ nke di ndu we si, Amen. Ndi-okenye ahu we da n'ala we kpọ isi ala.