NKPUGHE 3:17-18
NKPUGHE 3:17-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na ị na-asị, ‘abụ m ọgaranya, nwezuo ihe niile. Mkpa ihe ọbụla akpakwaghị m.’ Ma ị ghọtaghị na onye gba aka ka ị bụ. Ị bụ onye e kwesiri imere ebere. Ị bụkwa ogbenye na onye kpuru ìsì na onye gba ọtọ. Ana m adụ gị ọdụ ka ịzụta ezigbo ọlaedo nʼaka m, bụ ọlaedo a nụchara anụcha nʼime ọkụ. Mgbe ahụ, ị ga-abụkwa ọgaranya nʼezie. Ị gaara esitekwa nʼaka m zụta akwa ọcha na-enweghị ntụpọ ka ị ghara ịgba ọtọ, ka ihere gharakwa ime gị. Ka ị zụrụkwa ezigbo ọgwụ ọrịa anya tee, ka ibido ịhụ ụzọ nke ọma.
NKPUGHE 3:17-18 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na i nāsi, Abum ọgaranya. emewo ka m'buru ọgaranya, ọ dighi kwa ihe ọ bula nākpam; i mataghi kwa na gi onwe-gi bu onye ahu nāhuju anya na onye kwesiri ebere na onye dara ob͕eye na onye kpuru ìsì na onye nāb͕a ọtọ: aduam gi ọdú ka i zuru n'akam ọla-edo nke erechaworo n'ọku, ka i we ghọ ọgaranya; ka i zuru kwa uwe ọcha, ka i we bokwasi onwe-gi, ka ewe ghara ime ka ihere nke ib͕a-ọtọ-gi puta ìhè; ka i zuru kwa ọgwu-anya ite n'anya-gi, ka i we nāhu uzọ.